Nigeria senate: APC akpachapụla ndị Igbo n'ụgbọ?

Ọfọ ndị senate

Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook

Nkọwa foto, Ike Ekweremadu nọchiri Bukola Saraki na nzukọ ebe a bịara buru ọfọ a

Okwu akpụ n'ọnụ ugbua bụ okwu metụtara ndị ga-apụta dịka ndị isi ụlọomeiwu ukwu na nke nta.

Ka o si kwụrụ ugbua, ndị a kpụ aha ha n'ọnụ na ha nwereike ịpụta dịka ndị isi ụlọomeiwu ukwu na nke nta n'agba nke a na-aba bụ ndị ugwu na ndị ọdịda anyanwụ.

N'ụlọomeiwu ukwu, Ahmed Lawan bụ onye na-anọchite anya Yobe Nọt, bụ onye kepukepu si APC na-apụta na-ekwu na ọkwa onyeisi ha nwereike iru aka.

N'Ụlọomeiwu nke nta, ọ bụ onye na-anọchịte anya ọgbọ vootu Surulere bụ Femi Gbajabiamila, ka kepukepu sị na ndị isi APC na-akwado.

Mana, ụfọdụ ndị isi ha gbagotere n'ihe banyere ndọrọndọrọ ọchịchị n'ọwụwa-anyanwụ na-ekwu na o zighi ezi ma ya bụru na APC kpachapụrụ ọwụwa-anyanwụ n'ihe na-eme.

Rochas Okorocha tinyere ọnụ na ya bụ okwu mgbe ya na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari mechara nzukọ n'obi gọọmenti n'Abuja n'ụbọchị nke mbu nke ọnwa Eprelu, 2019.

Agbanyeghi nke a, APC akpọbeghị okwu aha.

Ike Ekweremadu

Ebe foto si, Ike Ekweremadu

Nkọwa foto, Ike Ekweremadu so na onye tọchara n'ụlọ omeiwu nke Naịjirịa ugbua

Nke a mere ka ụfọdụ ụmụafọ ọwụwa-anyanwụ jiri soro na-ndị na-achụ nta ịbụ ndi isi n'ụlọomeiwu abụọ.

Mmadụ dịka aka chịbụrụ Abia steeti bụ Orji Uzo Kalu na onye na-anọchịte anya Ụmụnneochi n'ụlọomeiwu nke nta bụ Nkechi Onyejiocha, apụtala kwuo na oche onyeisi ụlọọrụ ha ga-amasị ha.

Mana, ọnụ na-ekwuchitere APC na Lagos steeti bụ Maazị Joe Igbokwe gwara BBC Igbo na ọnọdụ ọwụwa-anyanwụ nọ ugbua n'ihe metụtara ọchịchị Naịjirịa si ha n'aka.

"Nwata so gbaa bọọlụ ga-eso racha oroma. Ị gaghị arụ ọrụ na UAC gawa ịnata ego UBA."

Orji Uzo Kalu

Ebe foto si, Orji Uzo Kalu/Facebook

Nkọwa foto, Orji Uzo Kalu ekwuola na ya chọrọ oche onyeisi ụlọomeiwu maọbụ osote ya

Na nkọwa Maazị Igbokwe, onye ga-abụ onyeisi ụlọomeiwu nke ukwu ga-abụ onye tara nchara n'oche.

Ọ sị: "Onweghị onye si ọwụwa-anyanwu tozuru. Asịghị na agaghi enye ya. Ọ na o tozughi makana ọ ka na-aga nke mbụ."

Igbokwe gara n'ihu kwuo na ebe ndị ọwụwa-anyanwụ dara ya bụ ebe o si metụta ịkpa nkata etu onye si mpaghara ahụ tozuru etozu ga-apụta dịka onyeisi ụlọomeiwu.

"Etu e si eme bụ edowe ya ụzọ abụọ. Ya abụghị nke a, ọ bụrụ nke a. PDP merie, kedụ ihe ga-eme? APC merie kedụ ihe ga-eme?

"A bịa na sineti, edobe mmadụ adịghị ama ama APC merie, enye onye tozuru nwereike ịpụta.

"O kwesịrị ihe a kpara akpa, ihe anyụkọrọ mamịrị ọnụ wepụta. Mana anyị were ihe niile tinye n'otu nkata. Lezienụ ihe na-eme ugbua."