Rochas Okorocha: Victor Umeh erughi onye Rochas ga-atụpụrụ ọnụ - Onwuemeodo

Ebe foto si, Facebook/Rochas Okorocha
Sam Onwuemeodo bụ ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha gwara BBC Igbo na ọga ya agaghị asa okwu Victor Umeh kwuru maka ya.
Onwuemeodo kwuru sị na Rochas abụrụla "akwaa akwụrụ", na nke a mere na ha agaghị abịa "gbuwe oge ha ịtụpụrụ Umeh ọnụ".
O kwuru na ịtụpụrụ Umeh ọnụ bụ "ime ya ka ọ dị ka ọ bụ mmadụ ebe ọ na-abụghị".
Gịnị butere okwu a?
BBC Igbo gbara Victor Umeh bụ onye otu pati APGA ajụjụ maka ihe sere ya na Rochas mere o ji si n'otu ahụ pụọ.
Umeh zara sị na enweghi ihe na-esere ha iche.
O kwukwara etu o si dụọ Rochas ọdụ gbasara ọchịchị na ihe ga-eme mgbe ọ ga-aritu n'ọchịchị, mana Rochas ghaghapụrụ ha ma dinye ndị mmadụ ka ha kparịa ya.
Umeh gakwara n'ihu kwuo na Rochas ji akụnaụba ndị Imo steeti na-elekọta ezinaụlọ ya.
Akụkọ ga-amasị gị:












