Rochas Okorocha: Haaranụ Ndigbo ọkwa onyeisi Sineti

Akụkọ kachasị sepụte isi taa:

Rochas zutere Buhari na Monde

Rochas Okorocha na Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Lauretta Onochie

Nkọwa foto, Rochas Okorocha bụ onye na-akwado si onyeisiala Naijiria bụvMuhammadu Buhari ike

Gọvanọ Rochas Okorocha na onyeisiala Buhari nwere nzuko n'Abuja ụbọchị Monde.

Okorocha sị na ọ gwara Buhari ka e nye Ndigbo isi ọchịchị n'ụlọomeiwu.

Ọ kpọkwara Buhari oku ka ọ bịa gbape ọrụ ndị ọrụrụ n'Imo Steeti tupu ọ na-apụ.

Kpụpụnụ ndị SARS gbagburu Kolade Johnson ụlọikpe- Amnesty Int'l

Ndị SARS

Otu Amnesty International akpọọla oku ka e nyocha ogbugbu ndị e chere na ha bụ ndị SARS gburu otu onye egwu bọọlụ na-amasị bụ Kolade Johnson na Legọs.

A gbagburu nwaokorobia ahụ na Mangoro, Legọs, ụbọchịụka nke oge ndị SARS na-achụ nwatanwoke ọzọ ọsọ n'agbataobi ebe Johnson na-ekiri bọọlu.

Mbaụwa na-eru ụjụ Nipsey Hussle

Nipsey Hussle

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ ndị mmadụ hụrụ egwu 'Rap' n'anya n'ụwa niile nọ n'iru uju n'oke olu

Ọ bụ n'ihi ọnwụ otiegwu 'Rap' a kpọrọ Nipsey Hussle bụ onye ndị ojiegbe gbagburu na Los Angeles mba Amerịka.

Pope Francis kwuru na Messi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pope Francis kwuru na Messi abụghị Chukwu

Unu etozila Lionel Messi ka ọ bụ Chineke -Pope Francis

Biko onye na-ama ọkwa nke a?

Nke a bụ okwu onyeisi ụka Katọlik na mbaụwa bụ Pope Francis

Pope Francis kwenyere na Messi mara nke egwu na-akụ na bọọlụ mana o rughị ịkpọ ya Chineke dị ọtụtụ ndị mmadụ na-eme.

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Nwodo ị dị anyị mma - Ohaneze

Aha onyonyo, Ihe Ohaneze jiri kwụnyere Atiku - Nnia Nwodo

Ndị isi indi Ohaneze Ndigbo kpebiri na nzukọ ha mere n'Abakaliki ụnyaahụ na Nnia Nwodo ka tozuru ịbụ onyeisi oche ha.

Ndị akpọrọ "National Executive Committee" (NEC) nke Ohaneze kwenyere na atụmatụ onyeisi Ohaneze n'Enugwu bụ Alex Chiedozie Ogbonna wepụtara wee nye Nwodo ihe Bekee kpọrọ "Vote of Confidence".

Cheta na Ohaneze nweburu kepukepu ekweghim ekweghim maka nkwado ha nyere Atiku Abubakar nke ụfọdụ n'ime ha sị ezighiezi.

Nkwado a mere ka Ohaneze kwewa abụọ, nke onye bụbụ odeakwụkwọ otu ahụ bụ Uche Okwukwu mechara kwuo na ha enyela Nwodo ezumike.

Ozu ndị e gburu na Zamfara na 2013

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Nsogbu ndị ozuu ehi atala isi ọtụtụ ndị mmadụ na Zamfara steeti

Ogbugbu mmadụ ka na-eme kwa na Zamfara

Ndị eche na ha na-ezu ohi ehi wakporo ime obodo Kware dị na mpaghara Shinkafi na Zamfara steeti.

Ndị uweojii sị na mwakpo a tara isi mmadụ iri.

Na nke metụtara akụkọ a, ndị agha Naịjirịa sị na ha ga-amalitela ibuso ndị na-akpa ike a agha site n'atụmatụ ha kpọrọ "Harbin kụnama"

Zamfara, Sokoto na Katsina bụ steeti ndị ga-ahụ agha.

Abdelaziz Bouteflika

Ebe foto si, AFP

Na ofesi

Onyeisiala Abdelaziz Bouteflika nke Algeria achụọla ọtụtụ ndị ime obi ya.

Bouteflika bụ onye ọtụtụ ndị ọ na-achị na-eme ngagharị iwe na-asị ya laba laba chụrụ mmadị iri abụ n'otu n'ime mmadụ iri abụọ na asaa sọ ya arụ ọrụ dịka minista.

Zelenskiy ebe ọ na

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ụkwụ Zelenskiy ọ ga-aba ọchịchị obodo?

'Obi dị m ụtọ mana mpụtara a abụghị ngwụcha ya'

Ndị obodo Yukreni (Ukraine) onye ntụọchị amaama bụ Volodymyr Zelenskiy, e rigorotela akara onyeisi na ntuliaka ha, n'agbanyeghị na o nweghi ahumihe n'ihe gbasara ọchịchị obodo nke ọbụla.

Ha akpọpụtachabeghi Volodymyr Zelenskiy ka onye meriri ntuliaka, mana a na-enyo ya enyo dịka onye nwereike imeri ntuliaka agba nke mbụ dịka mpụtra jiri zi.

Ha sị na Volodymyr Zelenskiy na-eṅomi onyeisiala n'ihe onyoonyo anatala pacentị ntuliaka iri atọ na ọma (30.4%) ebe onye na-esote ya azụ bụ Petro Poroshenko nwetere 17.8%.

Ha abụo ekwuoala maka isiokwu ndị EU ha bụ n'uche, ha akwadola imekwa ntuliaka nke ọnwa na-abịa.

Gee nkeji BBC Igbo n'uju ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo, Egwu Chinyere Amaka Ifechukwu