Election 2019: Ihe m ga-eji garịrị ụlọikpe - Peter Obi

Peter Obi

Ebe foto si, Val Obienye

Nkọwa foto, Peter Obi kwuru na ọ ka kwenyere siri ike n'ulọikpe Naịjirịa

Agbanyeghị na ndị mmadụ arịọla ya ka ọ ghara ịga ụlọikpe gbasara mpụtara ntuliaka nke ọkwa onyeisiala emere n'ọnwa Februwarị iri abụọ na atọ, Peter Obi agbala isi akwara.

O kwuru na ọ ka nwere ezigbo okwukwe n'ụlọikpe Naịjirịa n'ihi na mkpesa ha n'ụlọikpe ga-eme ka ihe ọjọọ niile o kwuru mere n'oge ntụliaka nke ọkwa onyeisiala hapụ ịla na nta.

Mgbe Obi na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na be ya dị n'Onitsha, o bunyere ụmụ Naịjirịa ụkpa ekele etu ha si pụta n'uju ịtụ ntuliaka ọkwa onyeisiala emerela.

Peter Obi

Ọ gara n'ihu kwuo na ya bụ ntuliaka akwụghị ọtọ maọlị makana enwere ọtụtụ nwakpo, ogbugbu nakwa igwe "card reader" na-arụghị ọrụ n'ụbọchị ahụ.

Obi kwuru na nke a tinyere ụjọ na ndị si na mpaghara ọwụwa anyanwụ na ndị ndịda anyanwụ ma na-ekwu na onweghị nrụrụaka ka nke a.

Peter Obi

Ọ katọrọ etu ndị nọ na ọchịchị si wakpo ndị nọ na pati PDP ma ndị na-atụnyere ha vootu ma na-arịọ ka ndị mmadụ pụta n'uju tụọ vootu na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị