Presidential Election 2019: APC na PDP na-arụ onwe ha aka n'ọnụ banyere ntuliaka 2019

Onyeisioche APC bụ Adams Oshiomhole na mgbasaozi e wepụtara asaala Atiku Abubakar ebubo niile o mere gbasara mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala.
Oshiomhole kwuru n' ozi ọ gbasara n'Abuja ụbọchị Tọzde na mpụtara ntuliaka bụ nke igwe 'Card Reader' wepụtara, na ọ bụghị nke ndị mmadụ ji aka ha depụta ka o si sọ ha.

O kwuru na ndị mmadụ gbara mbọ ịdenye aha ha oge karịrị otu mgbe mana o nweghi isi.
Ọ mara atụ kwuo na o nwere ndị mmadụ ejidere ebe ha ji PVC ruru otu nde.
O kwuru na ọ bụrụ na Atiku nyocha APC na PDP ọ ga ahụ na ihe dị iche dị.
Ọ dọrọ APC aka na ntị ka ha ghara iji aka ha jiri kpaa ike na Satode gara aga soro ntuliaka ọkwa gọvanọ nke na-abịa n'izu ọzọ.
Lee ihe niile o kwuru ebe a
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Ngwa ngwa APC mechara mgbasa ozi nke ha site n'ọnụ Adams Oshiomhole,, PDP sochiri ha site na ịsaghari n'ọnụ odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Kola Ologbodiyan.

PDP boro ebubo na e jiri ndị agha were yie ndị mmadụ egwu ma mee wuruwuru na steeti ndị PDP gbanyere mgbọrọgwụ dịka Bayelsa steeti, Rivers na Akwa-Ibom.
Ologbodiyan boro ebubo na Rotimi Amaechi ji ndị agha gbanwee mpụtara Rivas steeti.
O bokwara Godwill Akpabio ebubo ideghari mpụtara ntuliaka n'Akwa-Ibom.
Kirie ihe Ologbodiyan. kwuru n'uju ebe:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









