PDP: Imachi mmadụ 50 njem megidere ikike dịrị ha

PDP

Ebe foto si, @OfficialPDPNig

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Otu PDP ajụla mmachi gọọmenti etiti machiri ndị mmadụ ruru 50 ịpụ Naijiria ga njem mba ọzọ.

Ụbọchị Satọde, gọọmenti etiti kwuru na ha na-amachi ndị ọnụ na-eru n'okwu ruru 50 ịga mba ọzọ dịka ha bidorola inyocha ha maka okwu gbasara mpu na aghụghọ.

N'akwụkwọ ozi nke odeakwụkwọ mgbasaozi nke pati ahụ bụ Kola Ologbondiyan binyere aka, PDP kwuru na 'iwu aka ike' ahụ megidere ọchịchị onyekwuucheya nakwa ikike onye ọbụla nwere ị ga ebe masịrị ya dịka ọ dị n'akwụkwọ iwu Naijiria nke afọ 1999.

PDP kwuru sị, "Anyị na-ele anya na atụmatụ ịmachi ụfọdụ ịga mba abụghị iji kpugbuo ụfọdụ ndị nwere agba."

"Ụwa niile ahụla ka ọchịchị nchịgbu siri eweghara ọchịchị onyekwuoucheya na etu ọchịchị Buhari siri jiri ụzọ agbasoghị iwu, na-enyopu onye ọbụla.

"A na-ejichi ngagharị nakwa mkpata ego na a gbasoghị iwu ọbụla."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ha gara n'ihu kwuo na atụmatụ ahụ bụ iji megide otu PDP na ndị pati anọghị na gọọmenti n'ihi egwu PDP.

N'okwu ha, PDP kwuru na mamịrị ọkụ n'awa gọọmenti etiti kemgbe Atiku meriri dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati dịka ọṅụ juru ọtụtụ ndị mmadụ obi ka nke ahụ mere.

Ha sịrị, " he nke a pụtara bụ na ụmụ Naijiria ọkachasị ndị nọ na pati abụghị gọọmenti, ndị ji ego achụ ego na ndị e chiri echichi nọ na nnukwu nsogbu n'ihi na gọọmentị nwere ike ịkpa ike megide ha."

Akụkọ ndị ga-amasị gị