Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania

Nchịkọta akụkọ niile si na mbaụwa niile

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ndị be anyị, ụnụ asaala chị?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde nke mbu na ọnwa Nọvemba 2025.

    Ka ọnwa ọhụrụ a nakwa ụbọchị ta mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

  2. A napụla Nwaeze Andrew aha, ụlọ. dịka nwaeze

    Ezinaụlọ Giufrre chọrọ ka eme nyocha dị omimi gbasara ihe mere Virginia Giuffre

    Ebe foto si, Getty and BBC

    Nkọwa foto, Ezinaụlọ Giufrre chọrọ ka eme nyocha dị omimi gbasara ihe mere Virginia Giuffre

    A napụla Nwaeze Andrew aha dịka nwaeze ma napụkwa ya ụlọ obibi ya nọ na Windsor maka ebubo otu nwaanyị a kpọrọ Virginia Giuffre boro ya na o dinara ya ugboro atọ ebe dị iche iche mgbe ọ ka bụ nwantakịrị.

    Cheta na Andrew tọgbọrọ aha eze ya na mbido ọnwa Ọktọba nke gunyere ‘Duke nke York’ dịka ndị mmadụ na-ajụ ya ajụjụ gbasara ọ dịka ndụ ya na nzuzo.

    Ezinaụlọ Giufrre chọrọ ka e mee nnyocha dị omimi gbasara ihe mere Virginia Giuffre.

    Foto gosiri Andrew na Virginia Giuffre, dịka Ghislaine Maxwell na-ele ha

    Ebe foto si, US Department of Justices/PA Wire

    Nkọwa foto, Foto gosiri Andrew na Virginia Giuffre, dịka Ghislaine Maxwell na-ele ha na-agbanyeghị na gọburu na ya ezutetubeghị

    Kedụ ihe atọ mere Eze Ingland ji napụ Nwaeze Andrew ugwu ya?

    Julian Payne bụbụ odeakwụkwọ Eze na Ezenwaanyị Briten gwara BBC Radio 4 "ozi ọhụrụ pụtara ọhụrụ n'izu ole na ole gara aka " gbanwere ihe nile..

    Andrew abụrụla nnukwu ihe na-akpasasị Ezinaụlọ Eze anya n'ọrụ ha kwesịrị ịrụ.

    Kedụ ihe mere eze jiri napụ Andrew ugwu ya?

    Ihe Payne sara bụ:

    1. A hụrụ ozi imelụ(email) nke gbaghara ihe Andrew kọburu mere

    2. A hụrụ akwukwọ nke Virginia Giuffre dere nke pụtara dịka ọ nwụchara

    3. A hụkwara foto gosiri Jeffrey Epstein ga ọ bịara mmemme na Windsor Castle

    Payne kwuru na Obieze na-agbaso obi ọha ndị mmadụ ma ghọta oge ọ dị mkpa ịnye onye ọ dịịrị ntaramahụhụ,

  3. Onyeisi 'RSF' nke mba Sudan ekwela nkwa inyocha ogbugbu egburu ndị mmadụ na el-Fasher

    Ọchịagha Mohamed Hamdan Dagalo amara ka Hemedti kwuru nke a dịka iwe na-arị elu maka ogbugbu egburu ndị mmadụ na el-Fasher.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọchịagha Mohamed Hamdan Dagalo a mara ka Hemedti kwuru nke a dịka iwe na-arị elu maka ogbugbu e gburu ndị mmadụ na el-Fasher.

    Onyeisi 'RSF' nke mba Sudan ekwuola na ọ ga-enyocha ogbugbu ndị otu ya gburu ndị mmadụ ka ha weghara obodo el-Fasher.

    Ọchịagha Mohamed Hamdan Dagalo a mara ka Hemedti kwuru nke a dịka iwe na-arị elu maka ogbugbu e gburu ndị mmadụ n' el-Fasher.

    O kwuru na obi dị ya njọ maka mkpamkpa dakwasịrị ndị el-Fasher ma kwuo na ndị otu ya mmebiri iwu nke ọ ga-ewepụta kọmiti ga-eme nnyocha.

    Mana onye ọrụ enyemaka kachasị elu nke UN bụ Tom Fletcher sị na nkwa RSF nyere na ha ga-egbochi ndị nkịtị mana nke a dị iche n’ihe a na-ahụ ugbua.

    Nsogbu dị n’etiti ndị ọrụ nchekwa Sudan na RSF abala nke afọ atọ ya ugbua.

  4. Ụtụtụ ọma Igbo bụ Igbo

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 31 Ọktoba 2025

    Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Ya gazie!

  5. Otu onye anwụọla n’ụlọelu dara n’Eko Legọs

    Ebe ụlọ dara n'Eko, Legọs

    Ebe foto si, lLASEMA

    Ụlọelu nwere nkeji atọ adaala n’Eko, Legọs steeti ma gbuo otu onye.

    Ụlọọrụ Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA) kwuru na nke a mere n’Ọktoba 30, 2025.

    Onyeisi ụlọọrụ LASEMA bụ Olufemi Oke-Osanyintolu kọwara na ọ bụ otu onye ka a hụrụ ozu ya mana e nwere ndị ọzọ ụlọ ahụ dakwasịrị bụ ndị azọpụtabeghị.

    O kwuru na ụlọ ahụ dara bụ ụlọ nke 28, n’ụzọ Baale Alayabiagba dị n’Eko.

    Nke a ga-eme ya ugboro atọ ụlọ na-ada na Legọs n’ime otu izuụka.

  6. Tanzania etinyela mmachi ngagharị n'ihi tigbuo zogbuo kposara ntuliaka

    Ngagharịiwe

    Ndị na-achị obodo Tanzania etinyela mmachi ngagharị na Dar es Salaam, bụ obodo mepere emepe kachasị buo ibu dịka ndị uweojii na ndị na-eme ngagharịiwe kwatachara n'ụbọchị ntuliaka.

    Ndị nọ n'ụlọgwụ 'Muhimbili Hospital dị n'obodo ahụ gwara BBC na ha hụrụ etu e si ebute ndị mmadụ merụụ ahụ aghara aghara,dịka a na-aatụ =vootu maka ntlika ọkwa onyeisiala nakwa ụlọomeiwu nke mba ahụ.

    A na-ele anya na ntuliaka ahụ ga-edubatakwa ọzọ Onyeisiala ha bụ Samia Suluhu na pati ya dịka onye kara aka so na Pati anọghị nọ ọchịchị nọ na mkpọrọ dịka e boro ya ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị., nke ọ gọọrọ ina aka ya dị ọcha. Pati ya jụkwara isonye na ntuliaka.

    Ndị na-eme ngagharịiwe bụndị chọrọ ka a a hazigharịa usoro ntuliaka ka ọ kwụrụ ọtọ sunyere ụgbọala ọkụ ma mebie ọtụtụ ewumewu nke gọọmentị.

  7. Onyeisiala Trump ebutuola tarifu ọ manyere na mbubata si Chaịna ma wepụ mgbochi ndị ọzọ dịka o zutere Onyeisiala Xi Jinping

    Oge Onyeisiala Trump mba Amerịka na Onyeisiala Xi Jinping mba Chaịna zutere onwe ha na Saụt Korịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na Amerịka na mba Chaịna nwereike ibinye aka na nkwekọrịta azụmahịa n’oge adịghị anya.

    Nke a na-abịa dịka ya na Onyeisiala Xi Jinping nwere mkparịtaụka na Saụt Korịa.

    Onyeisiala Trump kwukwara na Amerịka ebutuola tarifu ọ manyere na mbubata niile si mba Chaịna abata Amerịka mana Beijing ekwubeghị ihe ọbụla banyere nke a.

    Okwu Onyeisiala Trump bụ nke ọtụtụ kwuru na ọ ga-eweta udo na nsogbu azụmahịa dị n’etiti Amerịka na Chaịna kemgbe.

  8. Ụtụtụ Igbo bụ Igbo

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 30 Ọktoba 2025 ma bụrụkwa ahịa Afọ.

    Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Ya gazie!

  9. Gọọmenti Enugwu steeti atọhapụla mmadụ 86 n’ụlọmkpọrọ

    N’ime ndị ahụ atọhapụrụ bụ otu nwoke dị afọ irị asatọ na isii, nwoke ahụ bụ onye Okpanku dị n’okpuru ọchịchị Aninri n’Enugwu steeti.

    Ebe foto si, Enugu State Government

    Nkọwa foto, N’ime ndị ahụ atọhapụrụ bụ otu nwoke dị afọ irị asatọ na isii, nwoke ahụ bụ onye Okpanku dị n’okpuru ọchịchị Aninri n’Enugwu steeti.

    Mkpu ọṅụ n’ada ugbua n’Enugwu dịka gọọmenti steeti ahụ ahọpụtala ndị nga mmadụ iri asatọ na isii sị ha kwara ngwongwo ha si n’ụlọmkpọrọ “Enugwu Custodial Centre” laghachi n’ụlọ ha.

    Ntọhapụ a na-abịa dịka steeti ahụ na-eme mmemme kwa afọ nke a kpọrọ “2025 Jail delivery exercise” nke Nnukwu ọkaikpe Enugwu Steeti bụ Raymond Ozoemena nọ n’isi ya.

    N’ime ndị ahụ atọhapụrụ bụ otu nwoke dị afọ irị asatọ na isii, nwoke ahụ bụ onye Okpanku dị n’okpuru ọchịchị Aninri n’Enugwu steeti.

    Ọkaikpe Ozoemena kwuru ma nwoke ahụ gbara afọ iri asatọ na isii na-arịazi nnukwu ọrịa ụgbua n’ihi n’ọkala nka nke ukwuu ma nọkwaa n’ụlọmkpọrọ ọtụtụ afọ.

    Ka ya bụ mmemme na-aga n’ihu, Ozoemena kwuru na ndị ha tọhapụrụ gụnyere ndị nọ na-eche ikpe ha a kpọrọ ‘Awating trial’ ọtụtụ oge, ndị ahụike ha adịghịzị mma, ndị ekpere ikpe ezighi ezi ya na ndị ogbenye enweghị onye ga-ekwuru ha ọnụ ha.

    Onyeisi Enugwu Custodial centre bụ Valins Obizue kelere Gọọmenti Enugwu ka o siri belata ọnụọgụgụ ndị nọ na ya bụ ụlọmkpọrọ.

    Obizue gwara Ọkaikpe Raymond Ozoemena na Gọvanọ Peter Mbah ka ha meekwaa ya bụ mmemme ntọhapụ n’ụlọmkpọrọ abụọ dị na Oji-River nakwa nke dị na Nsụka n’ihi na ndị “Awaiting Trial” na ndị enweghị onye ga-ekwuchitere ha karịrị akarị ebe ahụ.

  10. E wepụtara ozu mmadụ abụọ n’ime ụgbọala dabara n’olulu ọwara a na-arụ ọhụrụ n’Aba

    Ụgbọala dabanyere n'onunu tọnel n'Aba, Abia steeti

    Ozu mmadụ abụọ ka e wepụtara n’ụgbọala dabanyere n’onunu ọwara ahụ a na-arụ ọhụrụ n’ebe Osisioma n’Aba, Abia steeti.

    Ndị gwara onye ntaakụkọ anyị okwu sịrị na mkpamkpa ahụ kpara n’ime abalị garaaga n’ihe dịka erekere iri na otu.

    Ha kọwara na ide mmiri tojuru ebe niile nke mere na ndị bu ụgbọala (Toyota Camry Spider) ahụ amaghị na ebe ha na-aga abụghị ụzọ ma dabenye n’ime ya.

    Mana mgbe e wepụtara ụgbọala ahụ ka a hụrụ ozu mmadụ abụọ ebe ndị ụlọọrụ Federal Road Safety Corps (FRSC) bịara buru ụgbọala ahụ.

    Ndị mmadụ na-atụ ụjọ na ọ dịka onwere onye ọzọ (nwaanyị) nọ n’ụgbọala ahụ ozu ya ka dị n’ime onunu ọwara.

  11. Ajọ ifufe ‘Hurricane Melissa’ na-achọ ịdakwasị mba Cuba dịka idemmiri na-akpa mkpamkpa na Jamaịka

    "Ikuku ahụ siri ike nke mmadụ enweghị ike iguzo ọtọ."

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, "Ikuku ahụ siri ike nke mmadụ enweghị ike iguzo ọtọ."

    Ajọ ifufe ‘Hurricane Melissa’ na-achọ ịdakwasị mba Cuba dịka ọ gafechara Jamaịka ma kpalite ajọ idemmiri na mba ahụ.

    Ugbua, ihe karịrị mmadụ puku narị asaa na-akwapụ na Cuba, dịka a na-atụkwa anya na oke ifufe ahụ ga-ada "n'oge na-adịghị anya", dịka ụlọọrụ National Hurricane Center si kwuo.

    Na Jamaica, Praịm minista Andrew Holness kwupụtara "mpaghara ọdachi" ma dọọ aka na ntị maka "mmetụta ndị na-emebi ihe"

    E kwuru na oke mmebi ahụ na Jamaịka agaghị amalite ịpụta ihe ruo mgbe chi bọọrọ - mana Holness dọrọ aka na ntị maka mmebi nke ụlọ obibi na ụlọọgwụ.

    Otu nwoke Jamaịka gwara BBC News na "ikuku ahụ siri ike nke mmadụ enweghị ike iguzo ọtọ", ebe otu nwanyị na-ekwu na "mmiri na-esi n'elu ụlọ m na-abịa - adịghị m mma".

    "Ikuku ahụ siri ike nke mmadụ enweghị ike iguzo ọtọ."

    Ebe foto si, AFP Via Getty Images

    Nkọwa foto, "Ikuku ahụ siri ike nke mmadụ enweghị ike iguzo ọtọ."
  12. Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa Wenezde 29 Ọktoba 2025.

    Ka ụbọchị taa maara anyị niile mma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Ya gazie!

  13. Mba Amerịka anapụla m akwụkwọ ịbata ala ha -Soyinka

    Wole Soyinka

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye ederede a ma ama bụ Wole Soyinka ekwuola na mba Amerịka napụrụ ya akwụkwọ ikike ịbata ala ha.

    Sonyinka onye kwuru nke a ụbọchị Tuzde dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu kwuru na ha kagburu ya n'afọ gara aga ma gwa ya ka o tinyegharịa akwụkwọ ọhụrụ ma ọ chọọ ịga Ala Bekee.

    Cheta na n'afọ 2016, Soyinka dọkara akwụkwọ nwamala Amerịka nke Bekee kpọrọ 'Green Card' iji gosi iwe ya na ahọpụtara Donald Trump dịka Onyeisiala mba Amerịka.

  14. Ntuliaka Anambara: INEC agbatịala mmechi ịnata akwụkwọ PVC

    ụfọdụ ndị bịara ịtụ vootu na-achọ aha ha na foto ha n'akwụkwọ ụlọọrụ Inec bipụtara
    Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị bịara ịtụ vootu na-achọ aha ha na foto ha n'akwụkwọ ụlọọrụ Inec bipụtara

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) na Bekee agbatịala ụbọchị mmechị ịnara akwụkwọ ikike ịtụ vootu a kpọrọ 'Permanent Voter Card' (PVC) na Bekee maka ntuliaka gọvanọ n’Anambara steeti ruo ụbọchịụka 2 Nọvemba, 2025.

    Ụlọọrụ Inec nye buru Ọktoba 29, 2025 ka ọ bụrụ ụbọchị a ga-emechị ịnara PVC.

    Mana onye na-ahụ maka mmụta na mgbasa ozi maka ntuliaka n’ụlọọrụ Inec bụ Victoria Eta-Messi kwuru na mgbatị a bụ inyere ndị mmadụ ruru ịtụ vootu aka ịnara akwụkwọ ikike ịtụ vootu.

    Ha nwere mkpebi a dịka ndị ọha nakwa ndị nwere mmasị rịọrọ ka e nye kwuo obere oge.

    Eta-Messi nyere ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha jiri obere oge e nyere ga nara PVC ha n'ebe ndị dị iche iche Inec kewapụtara.

  15. Etu otiegwu J Martins si gbanahụ ihe mberede ụgbọala

    E kwuru na ụgbọala ya ekweghị njikwa dịka ọ dara brekị, wee gbaaba n'ime oke ọhịa dị n'akụkụ ụzọ

    Ebe foto si, Emenike Iroegbu

    Nkọwa foto, E kwuru na ụgbọala ya ekweghị njikwa dịka ọ dara brekị, wee gbaaba n'ime oke ọhịa dị n'akụkụ ụzọ

    Onye otiegwu Naịjirịa a ma ama ma bụrụkwa onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Abịa Steeti na Njem Nleta na Ntụrụndụ, agbanahụla ihe mberede ụgbọala dị egwu n'enweghị mmerụ ahụ ọbụla, dịka ụlọ mgbasaozi mpaghara siri kwuo.

    Martins Okechukwu Justice bụ nke a maara nke ọma dịka J Martins gbanahụrụ ihe a mere na Satọde n'okporoụzọ gawara Enugwu-Aba-Pọt Hakọt mgbe ụgbọala ya ekweghị njikwa dịka ọ dara brekị, wee gbaaba n'ime oke ọhịa dị n'akụkụ ụzọ.

    Agbanyeghị n'ụlọ mgbasaozi BBC News Igbo enweghị ike ịchọpụta ma nke a ọ bụ eziokwu n'ihi na otiegwu a azaghị ekwentị ya mgbe anyị kpọtụrụ ya mana ndị ya na ya na-arụkọ ọrụ gwara anyị na ọ bụ eziokwu.

    Dịka ụlọ mgbasaozi mpaghara siri kwuop, J Martins kelere Chineke maka ịzọpụta ndụ ya mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ; o kọwakwara ihe merenụ dịka ọrụ ebube.

  16. Mmadụ atọ anwụọla na Jamaịka dịka mba ahụ na-agabiga oke ifufe kachasị ike n'ụwa

    A na-adọkwa aka na ntị na ifufe ahụ nwereike irute mba Cuba na Bahamas nọ na ndịda ọwụwa anyanwụ

    Ebe foto si, NOAA via Getty Images

    Nkọwa foto, A na-adọkwa aka na ntị na ifufe ahụ nwereike irute mba Cuba na Bahamas nọ na ndịda ọwụwa anyanwụ

    Oke ifufe kachasị ike n'ụwa n'afọ a na-abịaru nso na Jamaịka ka ọ na-agbagharị n’ugwu ọwụwa anyanwụ site na oke Osimiri Karịbbean.

    A na-ebo ebubo na oke ifufe ahụ kpatara ọnwụ mmadụ atọ na Jamaịka, nakwa ọnwụ anọ na Haiti na Domịnịkan Republic.

    Ka ọ dị ugbua, amalitela nkwapụ mmadụ n'ụlọakwụkwọ dịka mba Jamaịka na-emechi ụlọ akwụkwọ ma na-ebugakwa ụlọakwụkwọ ọha niile n'ịntanetị.

    Praịm minista mba Jamaịka bụ Andrew Holness, enyeela iwu ka a kwapụ ndị bi n'ebe dị ala ka ha na-akwado maka Oke Ifufe ‘Hurricane Melissa’ ịda.

    N’aka nke ọzọ, ọdọụgbọelu mba ụwa abụọ dị na mba ahụ bụ ọdọụgbọelu mba ụwa Norman Manley dị na Kingston na ọdọụgbọelu mba ụwa Sangster dị na Montego Bay, emechiela dịka ha kwụsịtụrụ ọrụ niile n'izu ụka a.

    Ndị na-ebu amụma kwenyere na o nwereike ịbụ ajọ ifufe kachasị sie ike metụrụla mba Jamaịka, nke nwere ifufe nke 290km/h na 101cm (40 inch) nke mmiri ozuzo.

    A na-adọkwa aka na ntị na ifufe ahụ nwereike irute mba Cuba na Bahamas nọ na ndịda ọwụwa anyanwụ.

  17. Ụtụtụ ọma, ụmụ Igbo anyị ji eme ọnụ

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 28 Ọktoba 2025.

    Anyị na-asị ka ọ dịrị onye ukwu mma ma dịkwara onye nta mma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Daalụ!

  18. Otu onye anwụọla, ebe ndị ọzọ ka tọọrọ n’ala dịka ụlọelu ogogo abụọ dara na Legọs

    Ebe ụlọelu ogogo abụọ dara

    Ebe foto si, NEMA

    Akụkọ na-eru anyị ntị na ekwu na otu onye anwụọla , ụfọdụ ka tọrọ n'ụlọelu ogogo abụọ dara na Legọs n'ụtụtụ Monde.

    Ụlọọrụ gbatagbata 'National Emergency Management Agency' (NEMA) ngalaba nke Legọs kwuru na ha azọpụtala mmadụ 13 n'ime ndị tọrọ n'ụlọ dara na mpaghara Ebutte Meta na Legọs bụ Monde, abalị 27 nke ọnwa Oktoba afọ 2025..

    ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ụfọdụ ndị bi n'ụlọ ahụ ka nọ n'ụra oge ọdachi ahụ dagidere ha.

  19. Ndịagha mba ụwa agaghị achọ imejuputa udo Gaza - Eze Jọdan

    Ndịagha mba ụwa agaghị achọ imejuputa udo Gaza - Eze Jọdan

    Ebe foto si, AFP via Getty

    Nkọwa foto, Ndịagha mba ụwa agaghị achọ imejuputa udo Gaza - Eze Jọdan

    Eze Abdullah nke Jọdan gwara BBC na mba dị iche iche ga-ajụ ma a gwa ha ka ha "mee ka" udo dị na Gaza ma ọ bụrụ na e tinye ha n'okpuru atụmatụ Onyeisiala Donald Trump maka ịkwụsị agha.

    Ka atụmatụ udo nke Onyeisiala mba Amerịka siri kwuo, mba Arab na ndị mmekọ mba ụwa ga-ewepụta ndịagha nke "ga-azụ ma nye ndị uweojii Palestine nkwado na Gaza, ma chọpụta ọtụtụ ihe n’aka Jọdan na Ijipt bụ ndị mara ịhe banyere ọrụ ahụ."

    Atụmatụ ahụ kwukwara na Hamas ga-ahapụ ngwaagha ma hapụkwa njikwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke okeala ahụ.

    "Gịnị bụ iwu nke ndị nche nọ n'ime Gaza? Anyị na-atụkwa anya na ọ bụ udo, n'ihi na ọ bụrụ na ọ bụ ime ka udo dịgide, ọ dịghị onye ga-achọ imetụ aka na nke ahụ," ka Eze Abdullah kwuru.

    O kwuru na Jọdan na Ijipt dị njikere ịzụ ndịagha nchekwa Palestine.

    Okwu Eze ahụ na-egosi nchegbu sitere n'aka mba Amerịka na mba ndị ọzọ banyere ịdọba ha n'agha na-aga n'ihu n'etiti Hamas na Izrel, ma ọ bụ Hamas na otu ndị Palestine ndị ọzọ.

  20. Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 27 Ọktoba 2025.

    Ekpere anyị bụ ka izu ọhụrụ a mara anyị niile mma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Udo dịrị gị!