2019 Election: Anyị ga-enwe mmejupụta ntụliaka ọzọ na Rivas - INEC

Ntuliaka

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, INEC na-ekwe nkwa na ha ga-eme ka ntuliaka nke 2019 ga n'ụzọ ziri ezi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ dị mkpa

Ụlọọrụ INEC ekwupụtala na a ga-enwe mmejupụta ntụliaka ọzọ n'ụfọdụ ebe dị icheiche n'ụbọchị Satọde, abalị iri na atọ ọnwa Eprel, 2019 maka ọkwa gọvanọ nke steeti Rivas.

N'ozi ha zipụtara n'igwe mgbasa ozi Twitter ha, INEC kwuru na nke a so n'usoro mpụtara nke ụlọọrụ a wepụtara mgbe ha tụlechara ka e si mee ntụliaka ọkwa gọvanọ na steeti ahụ.

Ọ gaziri n'ihu ma gosipụta afọ ojuju ya n'usoro bụ ịgba ndị ma nke ekwe n'akụ jiri sonye iji mee ka enwee ntụliaka gara nke ọma.

Ka osila dị, ụlọọrụ a nọọrọ n'ụbọchị Wenezde, abalị atọ ọnwa Eprel, 2019, ma kpọpụta aka na-achị steeti Rivas bụ Nyesom Wike dịka onye nwetara mmeri na ntụliaka ọkwa gọvanọ nke steeti ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'otu aka ahụ, ụlọọrụ a kwukwara na ha lebara anya ka ntụliaka nke Sineti nke ọgbọ nta vootu Imo North siri gaa, bụ nke e mere n'abalị iri abụọ na atọ, ọnwa Febụwarị, nakwa abalị itolu nke ọnwa Maachị.

Ọ rụtụrụ aka na-ahụtara ụfọdụ ihe ndị koro achịcha na ya, bụ nke mere ojiri hiwe otu kọmiti ga-eleba ya anya.

Rita Orji

Kpọpụta Rita Orji dịka onye meriri - Ọkaikpe

Ọkaikpe Bello Kawu nke ụlọikpe nọ n'Abuja agwala ụlọọrụ Inec ka ha kpọta Rita Orji dịka onye meriri na ntuliaka ịnọchite anya mpaghara Ajero-Ifelodun Lagos n'ụlọomeiwu nta.

Rita Orji bụ nwada Igbo banyere n' oche ahụ n'afọ 2015, ma zọọ ọkwa ahụ ọzọ na ntuliaka 2019.

Aka akparala ndị gburu Fada Clement Ugwu

Onyeisi ndụ ụka Katọlik n'Enugu ekwuola na ndị ntọrị wekọrọ ego niile dị na ATM Fada Clement ha tọrọ ma gbuo ya.

Ụbọchi niile bụ nke onye ohi mana otu ụbọchị bụ nke onye nwe ụlọ

Mmadụ abụọ so n'ime ndị a na-enyo enyo tọọrọ ma gbuo ụkọchukwu Katọlịk bụ Fada Clement Ugwu amaala n'ọnya ndị uweojii Enugwu Steeti dịka ndị uweojii Enugwu siri kwuo n'ozi ha wepụtara.

N'ofesi

Charles Michel

Ebe foto si, Reuters

Praịm mịnịsta mba Beljọm bụ Charles Michel na-arịọ mba Burundi, DR Congo na Rwanda n'ihi ihe ọjọọ ha mere n'oge ọchịchị nwa bekee.

Ọ rịọrọ mgbaghara maka ị tọrọ ụmụaka ndị mba ahụ nwere agbụrụ abụọ, nke ndị isiọcha na ndị isioji mụkọrọ ọnụ.

Ntọrọ a metụtara ụmụaka ruru puku iri abụọ mere n'oge mba Beljọm na-achị mba ndị a.

N'egwuregwu

Otu egwuregwu Super Falcons

Ebe foto si, Twitter/NFF

NFF akpọbatala Per Harlsson na Matti Demegard dịka ndị ga-eso na-achịkọta Super Falcons na nkwado ha maka asọmpi Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị nke afọ a.

A ga-agba asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 2019 na mba Fransị n'ọnwa Juun.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Lee ihe omimi ị maghị maka ọjị

Akụkọ dị mkpa nke ụtụtụ

Ndị chọrọ ka a kwụsị ịtụ mgbere

Ebe foto si, Getty Images

Ketil Karlsen bụ onye nnọchiteanya ndị European Union na Naịjirịa na otu ECOWAS, adọọla aka na ntị sị na Naịjirịa ka bụ ebe ndị mmadụ na-atụ mgbere akwụna.

O kwukwara na Naịjiria so na ndị isi n'ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ, imanye mmadụ ọrụ n'ike nakwa mpụ ndị ọzọ.

O kwuru sị na ndị ngalaba EU achọghị ịkwụsị ndị mmadụ ime njem mbịarambịara, kama na ihe ha chọrọ bụ ịkwụsị ndị na-eji ya emekpa ndị mmadụ ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere otu EU na Naịjirịa bụ Modestus Chukwulaka bụ onye kwuputara nke a n'ozi o kesara.

Karlsen kwuru nke a ka ụgbọelu nke 64 bulatara ndị Naịjirịa gbara ọsọ mbịarambịara, tụrụ ụkwụ na Naịjiria.

Mmeri Wike:

Ụkpa ekele ka na-arị ibe ya elu maka mmeri Nyesom Wike meriri na ntuliaka Rivas steeti.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Atiku Abubakar, Peter Obi, Ifeanyi Okowa, nakwa Ben Murray-Bruce na-eto Wike maka ihe ha kpọrọ 'imeri ndị na-agba ọchịchị onyekwuoucheya mgba okpuru.'

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa na ha agbake - IMF

Ngalaba na-ahụ maka akụnaụba na mbaụwa bụ International Monetary Fund, kwuru nke a ka ha na-akụpụrụ onyeisiala Muhammadu Buhari aka n'atụmatụ ikwalite akụnaụba obodo ọ na-atụpụta.

N'ofesi,

Ọ dịkwa ka Brenton Tarrant onye a na-enyo maka igbagbu mmadụ iri ise bụ ndị ụka alakụba na mba New Zealand abanyela ofe dị ọkụ.

Tarrant

Ebe foto si, EPA

Ndị uweojii mba ahụ ekwuola na ọ ga-azara ọnụ ya n'ụlọikpe maka ogbugbu mmadụ iri ise a nakwa mmadụ iri atọ na itoolu ndị ọzọ ọ nwara igbu.

N'egwuregwu,

Ngwongwo e ji mara Zinedine Zidane kụwasịrị n'abalị, ka o nwetara nzọgbu ya nke mbụ kemgbe ọ malitere ịchịkọta Real Madrid ọzọ.

Zidane

Ebe foto si, Getty Images

Valencia ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu zọgbuo Madrid, bụ nke ugboro itoolu a na-emeri ha na La Liga n'afọ a.

Gere akụkọ ndị ga-amasị gị n'otu nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile