Amerịka achụlatala ụmụafọ Naịjirịa ruru 34

ndị mbịambịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E sikwa mba Libya chụlata ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na mbido afọ a

Opekatampe mmadụ 34 bụ ụmụ Naịjirịa ka ndị Amerịka chụghachitere Naịjirịa maka na ha kpara arụ n'obodo ahụ.

Ndị ahụ achụlatara gụnyere ụmụnwoke mmadụ 32 na ụmụnwanyị abụọ.

Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii n'ọdọ ụgbọelu Legos steeti bụ Joseph Alabi kwupụtara nke a nye ndị ntaakụkọ.

O kwuru na mmad 25 n'ime ndị kpara arụ gbasara ọgwụike ebe ndị ọzọ dara iwu gbasara ndị mbịara mbịara.

Alabi kwuru na ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata na Naịjịrịa bụ Nigerian Immigration Service (NIS) na Bekee na ndị na-ahụ maka ịkwụsị mgbere mmadụ a na-akpọ National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons na ndị uweojii bụ ndị nabatara ndị ahụ achụlatara.

Ndị ọrụ njem ụgbọelu nọkwa ebe ahụ soro nabata ha nakwa ndị na-ahụ maka ịkwụsị ibubata na ibupu ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug and Law Enforcement Agency.

O kwukwara na otu ndị ahụ dị icheiche debere aha ndị ahụ n'ebe di icheiche tupu e bulaa ha n'ebe ha ana-aga.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ