Father Clement Ugwu: Anyị ejidela ndị ahụ gburu ụkọchukwu n'Enugwu - Ndị uweojii

Ndị uweojii na steeti Enugwu ekwuola na ha anwụchiela mmadụ abụọ a na-enyo enyo na aka ha dị n'ogbugbu e gburu otu ụkọchukwu Katọlik n'Enugwu bụ Rev. Fada Clement Rapụlụchukwu Ugwu na nso a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ebere Amaraizu n'ozi o zipụrụ ọhanaeze nyere aha ndị a dịka, Sunday Chibuko, bụ onye si Ụmụnna Ndịagụ nke dị n'Okpuru Ọchịchị Ezeagụ,ma bụrụkwa onye gbara afọ 32, nakwa Benjamin Osogwu onye gbara afọ 28, onye Obollo Eke nke dị n'Okpuru Ọchịchị Udenu nke steeti ahụ.
Ọ kọwara na anwụchiri ndị agamevu a na-abalị 28 nke ọnwa Maachị, 2019, na-ebe nzuzo ha dị n'ogbe Area 1 Garki, Abuja, site n'usoro nchọpụta tara ọchịchị nke ndị uweojii.

O kwukwara na ndị a ana-enyo enyo ka ọdị ugwu a na-enyere ndị uweojii aka na mbọ ha na-agba ịnwụchikwa ndị ọzọ, bụ ndị amaghị ebe ha gbagara ugbu a.
Akụkọ ga-amasị gị:





