Father Clement Ugwu: Ndị anyị nwuchiri tọrọ Fada Lazarus Ekwueme, ọ bụghị ndị gburu Fada Clement - Ndị uweojii

Aha onyonyo, Kidnappers: Ndị ntọ asaala asịsa

Ụmụokorobịa asaa aka ọrụ ha bụ ịtọrọ ndị mmadụ ma napụ ndị nwe ha nde kwụrụ nde ego amaala n'ọnya ndị uweojii n'Enugwu.

Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Suleiman Balarabe kọwaara ndị ntaaakụkọ na ndị ọrụ ya na-achụ ndị isi aba okpu ahụ kemgbe tupu ha anwụchie ha ụnyaahụ.

Balarabe kwuru na ndị ntọrị ahụ ha jidere abụghị ndị gburu Fada Clement Ugwu kama ọ gwara ndị Enugwu nakwa ndị ụka Katọlik ka ha dere jụụ na oge adịghị anya aka ga-akpara ndị ọṅụ ọbara ahụ.

Ndị a na-enyọ na ha bụ ntọ
Nkọwa foto, Ndị uweojii na-enyọ na ha bụ ntọ na-akpa mkpamkpa n'Enugwu steeti

Ọ kọwara na ụfọdụ n'ime ha so na ndị gburu otu Fada a kpọrọ Fada Lazarus Ekwueme, onye ha tọrọ n'ụzọ Nsụka.

Mana ndị uweojii siri imi n'ala were sipụta ebe ha nọ nwụchie ha na Pọtakọt.

Mmadụ asaa ahụ akpọpụtaara ndị ntaaakụkọ bụ ndị sị na mpaghara ugwu nke Zamfara na Kebbi steeti.

Ndị a na-enyo na ha bụ ndị ntọ
Nkọwa foto, Ndị a na-enyo na ha bụ ndị ntọ

Otu onye na ndị ahụ a na-enyo enyo a kpọrọ Salisu Mohammed si Zamfara steeti kwuru na ya na ndị otu ya sị mgbago Ugwu Naijirịa bịa biri na Benin, ebe ahụ ka ha si a bịa Enugwu na Anambara na-atọrọ mmadụ.

O kwuru na onye nke ikpeazụ ha tọrọ tupu ndị uweojii ejide ha bụ onye ọcha ha napụrụ ezigbo ego.

Ndị uweojii nwụdekwara onye ohi ji egbe egbe ụmụaka akpa ike n'Enugwu

Kọmishọna ndị uweojii Enugwu steeti
Nkọwa foto, Kọmishọna,Suleiman Balarabe, ndị uweojii Enugwu steeti ka ọ na-akwa ndị ntaakụkọ okwu

Ha gosikwara Otu nwata nwoke gụchara Banking and Finance na UNN were kpebie iji egbe adigboroja anapụ ndị mmadụ ihe ha.

Mgbe BBC gbara ya ajụjụ ọnụ, onye ahụ a na-enyo na ọ bụ onyeohi si Awgu n'Enugwu steeti aha ya bụ Uche Emmanuel kwuru na ya abụghị onye ohi kama na ya na-eji egbe ụmụaka baa n'ụlọ mmadụ zue ya ohi.

O kwuru na egi ya na ezute bụ nke ya ga eji gas obodo oyibo.

Akpụtakwara otu n'ime ndị ohi gbagburu onye ọrụ ngo rụrụ Miliken hill Enugwu n'afọ gara aga ya na ụmụ akwụkwọ sekọndịrị na-eme ihe otu nzuzo.

Dan Mallan kwuru na ndi uweojii mụzị anya ka azụ ugbua igosi ndị omekome mbe na abụọ nke bụ oke.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: