Education in Burundi: Ụmụaka atọ agaala mkpọrọ maka isekasi ihe na foto onyeisala

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụagbọghọ atọ agaala mkpọrọ maka ihe ha sekasiri na foto onyeisiala Burundi n'akwụkwọ.
Ụlọikpe ahụ kwuru na ha so n'ụmụ akwụkwọ asaa anwụchiri na mpaghara Kirundo province n'izu ụka gara aga mana a hapụrụ anọ n'ime ha.
Ihe ndị mmadụ na-ajuzi ugbua bụ, ọ bụ maka isekasi ihe n'ihu foto onyeisiala a chupkuru ụmụaka atọ a mkpọrọ?
Ụlọikpe kwuru na ha kparịrị onyeisiala Nkurunziza site n'etu ha si sekasie ihe n'ihu dị n'akwụkwọ ha ji agụ akwụkwọ,
O kwuru na ọ bụ ya ka ha ga-eji nọrọ na mkpọrọ ruo mgbe a ga-akpọpụta ikpe ha n'ụlọikpe.
Ha nwereike ịnọru afọ ise maọbụrụ na ikpe mara ha n'okwu a.
Akụkọ na-ekwu na nke a abụghị nke mbu udiri ihe a na-eme.
N'afọ 2016, ụmụaka iri na otu gara mkpọrọ maka etu esi bo ha ebubo na ha sekasiri ihe na foto Nkurunziza dị n'akwụkwọ ha.








