Rerun elections: Atiku etiele mkpu maka ọgbaghara dị na mmejuputa ntuliaka

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Atiku ebee maka mmejuputa ntuliaka

Atiku Abubakar

Ebe foto si, @atiku/Twitter

Ọ na-ede jimjim na Kano, Plateau,Sokoto ebe tigbo zogbo sochiri mmeju ntulika emere nke gọvanọ na ụlọomeiwe taa bụ satọde.

Onye ji ọkọrọtọ PDP bụ Atiku Abubakar ekwuola n'akara Twitter ya na ọgbaagha aghọla njirimara ya bụ mmeju ntụtilaka ebe atụrụ anya na Inec kwesiri itofe nke a ugbua.

Ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe

Ụmụnwanyị na ngagharị iwe
Nkọwa foto, Juliet Kaego na ụmụnwaanyị ndị ọzọ na-eme ngagharị iwe n'Ogbete Enugwu

N'Enugwu taa otu ụmụnwaanyị kwụrụ onwe nka nke Juliet Kaego kpokobara emela ngagharị iwe na ụzọ ma na ahịa.

Ụmụnwaanyị a dọrọ aka na ntị ma na-egosi iwe ha maka ịdọaka na mkparị ụmụnwoke na-enyaha n'ime ahịa ma ka ga-ịzụta ihe.

Emeriela Isis na Syria

Agha Syria

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndi agha nụrụ agha na Syria

N'ofesi, ndị otu busoro ISIS agha na Syria ekwuputala na oge ndị omekataraihepụụjọ akpọrọ Islamic State agaala na Syria.

Dịka ndị otu a kpọrọ onwe ha Syrian Democratic Force na-efegharị ọkọrọtọ ha na Baghuz bụ ọnọdụ ikpeazụ ndị Isis ha dọkwara aka na ntị na ndị otu ọjọọ a ka ga na-akpakwa mkpamkpa na mba ụwa.

Jose Mouriho ga-amalite ọrụ na Jun

Jose Mourinho

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Achụpụla Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Manchester United n'ọgbọ egwuregwu ihe ruru ugboro asaa kemgbe o ji bịa ọrụ na England

Onye nkuzi egwuruegwu bọọlụ dooro anya bụ Jose Mourinho ekwuola na mgbe adịghị anya na ya ga-amalite ọrụ na otu otu egwu bọọlụ.

Mourinho sị na otu anọ akpọọla ya maka ịmalite ọrụ na June na ya ga ahọrọ otu malite mewe ihe ejiri mara ya.

Gee nkeji anyị ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
F. John Bray

N'ime akwụkwọ ozi ha zigara BBC Igbo ha kwuru na ha nụrụ akụkọ nrụrụaka si na ntuliaka pụta.

Ha kwuru na ha nụrụ okwu mwakpo n'ebe dị icheiche ma zịgara ezinaụlọ ebe ndị mmadụ nwụrụ ozi itiakanobi.

"Dịka enyi mba Naịjirịa anyị bụ, anyị ga-akwado ọchịchị onyekwuoucheya nke ga-egosi uche ndị Naịjirịa" ka ha kwukwara.

Ozi ahụ dụrụ ndị niile ndọrọndọrọ ọchịchị gbasara ndụmọdụ si ha gbakọ aka mee ka ntuliaka ọbụla emere na Naịjirịa bụrụ nke ziri ezi.

N'otu aka ahụ

Mahmood Yakubu

Ebe foto si, Inec Official Instagram

Nkọwa foto, Mahmood Yakubu were oche dịka onyeisi Inec n'afọ 2015

Ngalaba Inec eweputala ụbọchị ọhụrụ a ga-eji gụkọ vootu ndị a tụrụ na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Rivas steeti.

Ụbọchị ha sepụtara bụ site n'ụbọchị 2 rue ụbọchị 5 nke ọnwa Eprelu.

Ha kwụsịrị ngụkọ ahụ n'ike n'ụbọchị 9 nke Maachị maka okwu mwakpo na-arị ibe ya elu.

Google a ga-emechi akara ozi ha?

Njirimara igbe ozi Google

Ebe foto si, Getty Images

Akụko na-ekwu na ndị odogwu na Teknụzụ bụ Google nwereike ịmachi ndị mmadụ iji akara igbe ozi ha bụ "Gmail app" na Bekee.

Ọ bidoro dịka ụfọdụ mmadụ na-ekwu na ha hụrụ ozi n'ekwentị ha na-agwa ha na ọ ga-apụ n'ụbọchị.

Na mba Briten,

Theresa May

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Theresa May

Webusait ndị mba UK adapịala ebe ndị mmadụ karịrị puku nari ise dakwasiri ya iji binye aka n'akwụkwọ ga-atụgharị Brexit.

Cheta na mba Briten nọ na jebe ejebe naba anaba gbasara okwu i si n'ọgbakọ mba Yurop sere isi ha.

N'egwuregwu,

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ndị mmadụ na-aṅụrị n'elu soshal midia ọ kachasị Twitter maka akara AS Roma malitere n'asụsụ pijin.

Gee Nkeji nke mgbede a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile