Imo steeti: Atụmaatụ Biometric na-egbubi ụgwọ ọnwa anyị - Ndị ọrụ

Ebe foto si, Getty Images/bbc
"Anyị anabataghị atụmaatụ Biometric nke ọchịchị Rochas wetara anyị makana ọ na-akabi ụgwọ nwa ndị ọrụ anyị".
Okwu a si n'ọnụ onyeisi ndị ọrụ Imo steeti bụ Austin Chilakpo na-ekwusi ike na atụmaatụ a ga-emebiri ndị ọrụ Imo ọtụtụ ihe.
Chilakpo gwara BBC Igbo na atụmaatụ a butere ọtụtụ nsogbu mgbe eji ya nwalee ndị na-ala ezumike nka.
Ọ gbaruru ihu etu gọọmenti Rochas Okorocha si were ya bụ atụmaatụ tinye n'aka ndị ndụmọdụ na-abụghị ndị ọrụ gọọmenti.

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na ọ ga-aka mma ka ọchichi Rochas Okorochas na-apụ apụ nye gọọmenti ọhụrụ na-abata n'ọchịchị atụmaatụ a ka ha leba ya anya mara etu ha ga-esi mee ya.
Mana ọnụ na-ekwuchitere Okorocha bụ Sam Onwụemeodo kwuru na atụmaatụ a aghaghị emetụta ụgwọ ọnwa ndị Imo steeti.

Ebe foto si, STRINGER
Onwuemeodo kwuru na onyeisi ndị ọrụ Imo na-ekwu okwu enyemaka ka Emeka Ihedioha hụchata ya nye ya ọkwa na gọọmenti ya.
Anyị jụkwara ya ka ọ kọwa ihe atụmaatụ nyocha pụtara, o kwuo si chọba onye ọzọ nọ na gọọmenti Okorocha ga-akọwa ya.









