Deji: Charlie Boy bụ meremere n'ihu gwọpịtị n'azụ

Aha nkeananụānụ, 'Ego APC nyere m bụ ego ihe onyonyo m mere ha, ọ bụghị akaazụ'
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Charles Oputa bụ otiegwu a ma-ama dịka 'Charly Boy' akọwala etu mmiri si banye opi ụgbọghọrọ n'ebubo e boro ya na ọ naara ndị ọchịchị Buhari ego iji katọọ Atiku Abubakar.

Onye na-alụ ọgụ maka ikike ruru onye a kpọrọ Deji Adeyanju ma bụrụ onye ya na Charly Boy jirikọrọ aka hiwe 'Our Mumu Don DO' boro Charly Boy ebubo ị nara gọọmenti etiti ego oge a tụnyere ya na mkpọrọ iji katọọ Atiku Abubakar ma kwụsịkwa ịkatọ Buhari.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Adeyanju kwuru na oge ya jụrụ Charly Boy nke bụ eziokwu, na Charly Boy n'ezie na ha nyere ya ego ma ego ahụ abụghị iji megide Atiku kama na ọ bụ ego ha nyere ya iji na-akwado ya bụ Charly Boy.

Deji na Charly Boy

Ebe foto si, @adeyanjudeji

Mana na mkparịtaụka BBC Igbo na Charly Boy nwere Oputa kwuru na ya ma ihe na-eri Deji Adeyanju nri n'afọ na ọ bụghị ebubo ọ na-ebo ya.

Oputa kwuru na n'ezie na Festus Keyamo bụ ọkaiwu APC nyere ya ego mana ego ahụ bụ ego ọrụ ọ rụrụ ha dịka onye na-emepụta ihe onyonyo.

"Ana m arụ ihe dị iche iche, ihe onyonyo, 'documentary'. Ihe niile m na-eme nwere akụkụ achụmtaego.

"E mechara m ihe onyonyo 'Park n Go,' ha na-asị na m naara ndị PDP ego, na ọzọ akpọrọ 'Another guy man wan enter' ha asị kwa na m nara ego.

"Agwaala m ndị mmadụ na APC na PDP o nweghị nke nwere isi. Ya mere m ji gwa ndị otu Sowore ka ha jịkọta ọnụ hazie 'Third Force."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

"Ihe butere okwu bụ na m chọtala ndị ọrụ NGO doro anya dịka onye ọ bụ kemgbe ha ji bata ka ọdịzị a ka ụgbọ na-achọ ịgha ha."

Mgbe BBC jụtara ọnụ Adeyanju, O kwuru na "Ihe Charly Boy mere tụrụ m n'anya." n'ihi na ọ wụrụ ya n'ala.

"Agaghị m ata ndị mmadụ na-agbagha Naijirịa aga mba ofesi ụta."

"Ka m tinye uchu na inwetakwa onwe m ọzọ."

Akụkọ ga-amasị gị