Catholic Church: 'Ndị ntọ wekọrọ ego niile dị na ATM Fada clement, gbuo ya' - Bishop Onaga

Aha onyonyo, Catholic Church: 'Ndị ntọ wekọrọ ego niile dị na ATM Fada clement, gbuo ya' - Bishop Onaga

A ga-akpọnụ nke a arụ ka arụ bikonu?

Bishop na-achịkọta ndị ụka Katọlik n'Enugu ekwuola ka ndị ntọrị si tọrọ ụkọchukwu Clement Ugwu, naa ndị be ya ego ruru nde naira iri abụọ ma wekọrọ ego niile dị na ATM ya tupu ha egbuo ya.

Gere ihe ndị ọzọ o kwuru mgbe a na-eli ya.