Robert Mugabe anwụọla n'afọ 95
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na bụ na Robert Mugabe bu onye mbụ chịrị Zimbabwe ka ha nwetere ọchịchị onwe ha awụọla n'afọ 95.
Ọ nwụrụ dịka ọ rịachara ọrịa dịka ezinaụlọ ha gwara BBC .
Mugabe bụ onye ndị agha chụpụrụ n'ọkwa n'ọnwa Nọvemba 2017, nke mechiri ọchịchị ọ malitere kamgbe afọ iri atọ.

Ebe foto si, AFP
Onye odeakwụkwọ n'ihe gbasara agụmakwụkwọ ya bụ Fadzayi Mahere dere na Twitter ''Laa n'udo, Robert Mugabe".
A mụrụ ya na 21 Febụwarị, afọ 1924 n'obodo a kpọrọ Rhodesia n'oge ahụ.
A tụrụ ya mkpọrọ n'ihe karịrị afọ iri na-ekpeghi ya ikpe mgbe ọ katọchara gọọmentị Rhodesia n'afọ 1964.
Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa suru kpọm n'ajụjụ ọbụla ndi mmadụ nwere maka ọnwụ Mugabe mgbe gbasara ozi maka ya n'akara Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Maazị Mnangagwa bụbụ osote Mugabe tupu achutuo ya n'ọkwa.
Nke a dị mkpa makana onwela ọtụtụ oge a na-ekwubu na Mugabe anwụọla, ma o mecha bụrụ asị.
Mgbe Mugabe malitere ọchịchị, ọtụtụ mmadụ n'ụwa dum na-eto ya maka etu o si haziegharịa ọnọdụ ahụike na agụmakwụkọ.
Ihe kpatara okwu bụ atụmatụ owepụtala iji nakọ ala ọ sị na ndị ọcha nara ndi be ha n'ike.

Robert Mugabe - Oge dị mkpa
- 1924: Ụbọchị amụru ya
- Omechara ga-akwụkwọ
- 1964: Gọọmentị mba Rhodesia tụrụ ya mkpọrọ
- 1980: Meriri ntụlịaka ka ha nwetere ọchịchị n'aka ndi ọcha
- 1996: Ọ nụrụ Grace Marufu
- 2000: Ọ dara ntụlịaka onye kwuo uche ya, ndị na-akwado ya buru egbe wakpo ụgbo ndị ọcha ma wakpokwa ndị ndọrọndọrọ anọghị n'ọchị
- 2008: Pụtara dịka onye nke abụọ emere, mana onye nke mbụ bụ Morgan Tsvangirai sepụrụ isi ka mwakpo ndị otu ya malitere
- 2009: Ka akụnaụba mba ahụ malitere ịda, o chere Tsvangirai iyi ọrụ dịka Praim Minista, bụ ọkwa o ji ruo afọ anọ
- 2017: Ọ chụrụ Osote Onyeisiala Emmerson Mnangagwa n'ọrụ, iji nye ohere ka nwunye ya bụ Grace ịnọchị anya ya
- November 2017: Andị agha Zimbabwe tinyere aka ma kwanye ya iritu n'ọchịchị.










