Robert Mugabe: Zimbabwe ọ ka mma ugbua karịa mgbe Mugabe nọ n'ọchịchị?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Nke si n'aka ndị otu "Reality Check"
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
Ebubo: "Ihe ka njọ ugbua na Zimbabwe karịa oge Robert Mugabe bụ onyeisiala." Onye kwuru nke a bụ Fadzayi Mahere onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị "Movement for Democratic Change (MDC)".
Nke bụ eziokwu: Ọ bụ ezie na n'ọnwa olemole gara aga, ọnọdụ akụnụba nke mba Zimbabwe akawanyela njọ. Mana enwere ọtụtụ mgbe ihe ka njọ karịa ka ọ dị ugbua oge Mugabe nọ n'ọchịchị.

Robert Mugabe chịrị mba Zimbabwe bido n'afọ 1980 ruo 2017 oge ndị agha chụturu ya.
Ka nke a mechara, Emmerson Mnangagwa, onye bụbu osote onyeisiala weghaara ọchịchị.
Mana ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-abụghị ndị nọ n'ọchịchị na-ekwu na ihe isiike ka njọ ugbua na mba ahụ karịa mgbe Mugabe na-achị.
Ha kpọrọ oku ka e mee ngagharịiwe n'ihi nke a nakwa ọchịchị nchịgbu si n'aka Mnangagwa.
Dịka ọnụọgụgụ gbasara akụnụba mba Zimbabwe si gosi, ọnọdụ akụnụba n'ime otu afọ dịka ọ na-akawanye njọ.
Ihe e ji gbakọọ nke a bụ nke bekee kpọrọ "gross domestic product (GDP) per capita", nke bụ ego ole otu onye nwere ike ịkpata n'obodo.
Ahụ na-afụ ndị mmadụ ụfụ na Zimbabwe ugbua n'ihi enweghị ọrụ nakwa mgbadata ụgwọ ọnwa.
Mana nke ahụ ezughị iji kwuo na ihe ka njọ ugbua karịa oge Mugabe na-achị.

Ebe foto si, Getty Images
Etu ọzọkwa enwere ike iji gbakọọ ọnọdụ akụnụba obodo bụ ile anya n'ọnọdụ azụmahịa.
Ọnọdụ azụmahịa na Zimbabwe adaala nke ukwuu kamgbe 2017.
Mana gọọmentị na-ekwu na ọ bụ ndị mba ndị ọzọ bara ọgaranya kpatara nke a.
Kamgbe 2002, mba Amerịka kpachiri enyemaka ha na-enye mba Zimbabwe iji taa ha ahụhụ.
Amerịka kwuru na ha agaghị akwụsị ntaramahụhụ ndị ahụ ganye na e nwee mgbanwe pụrụ iche n'ọchịchị na mba Zimbabwe.
Ọzọkwa bụ na ọnụego nri nakwa ihe ndị ọzọ agbagoola nke ukwu kamgbe a chutuchara Mugabe n'afọ 2017.
N'oge ahụ, mgbago ọnụego, bụ nke Bekee kpọrọ "inflation", dị pasentị ise, mana n'ọnwa Juun afọ 2019, ọ gbagoola ruo pasentị 176%.
N'ọnwa Ọgọst, ọnụego ngwaahịa na nri gbagoro karịa pasentị 611.

Ọgbakọ mba ụwa bụ "United Nations" kwuru na ọnụ nrị naanị gbagoro ruo pasentị 250.
Ihe mberede oke mmiri ozuzo na ajọ ikuku nke a kpọrọ "Cyclone Idai" na Bekee, nke mere n'ọnwa Maachị afọ a, mekwara ke ihe kawanye njọ mba Zimbabwe.
Ihe akabụ njọ na Zimbabwe?
N'agbanyeghi etu ihe si sie ike na Zimbabwe ugbua, onwere mgbe ihe ka njọ oge Mugabe nọ n'ọchịchị.

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 2007 ruo 2009, Zimbabwe gabigara oke ihe isiike ruo mgbe ego ha dịzi ka akwụkwọ nkịtị.
N'otu mgbe n'afọ 2008, ọnụego ngwaahịa rịrị karịa pasentị ijeri 500 (500 billion percent), dịka ọgbakọ UN si kwuo.
Onye ntaakụkọ BBC na mba Zimbabwe aha ya bụ Shingai Nyoka, kwuru na ihe ka njọ na 2008.
Nyoka kwuru sị: "N'afọ 2008, enweghị nrị ọbụla dị n'ahịa. Ihe ka njọ oge ahụ karịa ka ọ dị ugbua."
"Oge Mugabe banyere ọchịchị, ọnọdụ akụnụba dị mma ruo afọ iri na ise. Ihe dịịrị ndị isi ojii mma."
"Mana ọchịchị Mugabe n'afọ iri abụọ gara aga lara ọnọdụ akụnụba Zimbabwe n'iyi."
"Gọọmentị nọ ugbua ka na-achọ ụzọ imezi ụfọdụ ihe ndị mebiri emebi."
Ihe gọọmentị na-ekwu?

Ebe foto si, AFP
Gọọmentị Emmerson Mnagangwa na-ekwu na ha ewepụtala ọtụtụ atụmatụ ga-eme ka ọnọdụ akụnụba kawanye mma.
Ha ebutuola mmefu ego nakwa ụgwọ ọnwa a na-akwụ ndị ọrụ gọọmentị, ma bulie ụtụ isi.
Ha kwukwara na ụzọ ha ghe oghe maka onye ọbụla chọrọ ịbata obodo ha ịzụ ahịa.
Mana Godfrey Kanyenze, onye ọkacha mara n'ihe gbasara akụnụba, kwuru na "atụmatụ ndị ahụ mere ka ihe siwanye ike na Zimbabwe".













