Democracy Day May 29: Etu Gọvanọ Ugwuanyi, Umahi na Ikpeazu siri chịa steeti ha n'afọ ise a

Ifeanyi Ugwuanyi,David Umahi na Okezie Ikpeazu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Taa bụ Mee 29,afọ 2020 ka o mere afọ ise ụfọdụ ndị gọvanọ nọ n'Ọwụwa-Anyanwụ bara n'ọkwa ọchịchị na steeti ha ga; afọ n'agba nke mbụ ọchịchị ha na otu afọ na-agba nke abụọ ha.

Nchọpụta BBC Igbo mere n'ihe gbasara agụmakwụkwọ, ewumewu na-enyere ndụ aka (infrastructure) akụnaụba, onye kwuo uche ya (freedom of press) na ụfọdụ mere ọfụma, ebe ụfọdụ gbara ọnyụpa.

Lee ka ha siri kwụrụ n'ọsọ oroma dịka o siri gbasa ịgbara ndị steeti tinyere ha n'ọchịchị odibo:

Ifeanyi Ugwuanyi

Ifeanyi Ugwuanyi

Ebe foto si, Ifeanyi Ugwuanyi/Facebook

E duru Ugwuanyi n'iyi ọrụ n'abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee afọ 2015 ka o merichara na ntuliaka n'aha otu PDP.

Ya bụ nwa amadi bụ onye si n'Orba dị n'okpuruochichi Udenu..

Onye kwuo uche ya

E nwebeghị nsogbu ịkpachị ndị ntaakụkọ maọbụ onye ọbụla anọghị n'ọchịchị ikwu uche ya banyere ihe na-eme na steeti ahụ.

Otu onye ntaakụkọ bi n'Enugwu bụ Tony Adibe sị, "Kemgbe Ugwu anyị ji banye n'ọchịchị, anụbeghị na o nwere onye ntakụkọ a na-eji egwu."

Mwulite ihe na-enyere ndụ aka(infrastructure):

Ndị Enugwu kwuru na Ugwuanyị gbalịrị na ịrụ okporoụzọ mana e nwere ụfọdụ ebe, ọkachasị n'ime obodo e lere anya na ụkpụrụ ụkwụ ya ga-eru mana o rughị ya.

Adibe kwuru, "N'ihe gbasara okporoụzọ, ụzọ na-arịọ arịrịọ enyemaka, ọkụ 'street light' kwesịrị ịdị, mmiri kwesịị ilebanye anya."

Nsogbu ụkọ ezigbo mmiri ọnụnụ bụ nsogbu talara nchara n'Enugwu dịka gọọmenti pụọ, ọzọ abata ma ihe na-ebe ka na-ebe.

Mwulite ime obodo

Ụfọdụ ndị Enugwu na-ekwu na o chetaghị ndị bi n'ime obodo n'ọrụ mmepe ya.

Adibe kwuru, na "Ọ gbalirị n'Akpụgo mana Udenu ebe nsogbu ide na mbize na-eme ire o nweghị ihe ọ rụrụ ebe ahụ."

Okezie Ikpeazu:

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Facebook/Onyebuchi Ememanka

Otu onye ntaakụkọ ma bụrụkwa onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Ndudim Nwaoha tụlere ọrụ gọọmentị gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abịa steeti na ngalaba ndị a gụnyere;

Mwulite obodo (Okporoụzọ):

Nwaoha sị na gọọmentị Ikpeazu na-agbalị ike ya n'ịrụ ụfọdụ okporoụzọ n'Abia Steeeti dịka Ọsụsụ, Eziukwu dị n'Aba na ndị ọzọ.

Kama na ihe mere ya dị ka ọ na-agba ọnyụpa bụ na ndị Abia na-atụanya ọtụtụ ihe n'aka ya karịa ka o si arụ ọrụ.

Ọzọ bụrụkwa na o nwere ọtụtụ okporoụzọ ndị dị n'Aba e kwesịrị ilebanya kamgbe ndị ọchịchị gara aga nke a na-emebeghi ugbua. Okpotoụzọ ndị dịka Obiohia, Omuma nakwa ime 'Ngwa Road'.

Nwaoha sị na ihe kpatara nke a bụ na ndị chịburu na mbụ emezighi nke ọma na ọ bụrụ na ha mere nke a na ọrụ gaara adịrị gọvanọ Ikpeazu mfe.

Na nchekwa:

Nwaoha sị na ọnọdụ nchekwa n'Abia Steeti adịtụla mma karịa ka ọ dị n'oge gara aga.

Ọ sị na o nwere oge ndị mmadụ gbara ọsọ n'Abia n'ihi oke ohi na ntọrọ mmadụ mana ugbua na ndị mmadụ na ha alọghachị n'Abia maka na nchekwa adịtụla mma.

Kama na oge ụfọdụ na a na-anụta akụkọ ohi na ntọrị n'ụfọdụ ebe. Na ọ ga-enye gọọmentị Ikpeazu akara pasentị iri ise na nchekwa.

N'agụmakwụkwọ

A bịa n'agụmakwụkwọ, Nwaoha sị na ọtụtụ ụlọakwụkwọ ndị gọọmentị nwe eriela mperi, na ọnọdụ ha adịghịzị mma.

Na i hụ ụfọdụ ụlọakwụkwọ ndị dịtụ mma, a sị na ọ bụ nke ngalaba dịka Universal Basic Education (UBE), Niger Delta Development Commission (NDDC) na Petroleum Trust Fund (PTF) rụrụ.

Na nke a mere ọtụtụ nne na nna ji ewezuga ụmụ ha n'ụlọakwụkwọ gọọmentị nwe ma tinye ha na nke ndị mmadụ nwe.

Na nlekọta ndị ọrụ Bekee

Ndudim Nwaoha sị na nke banyere ọnọdụ ịkwụ ndị ọrụ Bekee ụgwọ n'Abia Steeti edochaghị ihe ya anya.

Na ndị ọrụ bekee na-ebe akwa na-eji ha ụgwọ ọnwa mana gọọmentị na-ekwu na ha akwụọla ndị ọrụ ụgwọ.

Mana nnyocha BBC Igbo mere na nso nso a banyere nke a gosiri na e jighi ndị ọrụ bekee na mịnịstrị ụgwọ mana ụfọdụ ndị ọrụ ahụike na ndị nkuzi ka e ji ụgwọ.

Kama ọnụ na-ekwuru gọvanọ Abia Steetị bụ Onyebuchi Ememanka sị na gọọmentị na-agba mbọ ịhụ na ọ kwachara ụgwọ ndị a.

David Umahi

Dave Umahi nke Ebonyi steeti

Dịka taa bụ Mee 29, 2020 mezuru ya afọ ise ọ chịwara, ọtụtụ ndị steeti ahụ ga-asị na Gọvanọ Umahi edebanyela aha ya n'ime obi ha site n'ihe ndị o merela na steeti ahụ.

Ogochukwu Anioke bụ otu onye ntaakụkọ na steeti ahụ tụlere ọrụ Umahi n'ime afọ ise a, n'ebe ọ metụtara agụmakwụkwọ, ahụike, mwulite obodo, nchekwa na ọdịmma ndị ọrụ Bekee.

Mwulite obodo (infrastructure):

N'ihe gbasara mwulite obodo, ihe mbụ onye ọbụla ị jụrụ ajụjụ na steeti ahụ ga-agwa gị bụ na "gọvanọ anyị na-agbalị n'ịrụ ụzọ na akwa".

Nke a bụ makana ọ bụ eziokwu na ọ rụọla ọtụtụ ụzọ e wusiri ike nakwa ụfọdụ akwa, ọkachasị n'Abakiliki bụ isiobodo steeti ahụ.

Ka ọ dị ugbua, ọ na-ekwukwa okwu iwu ọdọụgbọelu, dịka ọ na-ewu ụlọmkpọrọ ọhụrụ n'isiobodo steeti ahụ.

Ahụike:

A bịa n'ihe gbasara ahụịke, ọ na-ewu ụlọọgwụ nke nkuzi mahadum a kpọrọ Ebonyi state University Teaching hospital, n'obodo Uburu dị n'okpuru ọchịchị Ọhaọzara.

Ọ rụkwuola ebe a na-enyocha nje a kpọrọ "virology center" n'olu Bekee, ma tinyekwara ụfọdụ ndị ọzọ.

Ọ bụ eziokwu na ọ rụrụ ihe ndị a gbasakwara nlekọta ahụike, mana Anioke kwuru na ọ ka fọtụkwara bụ ihe ndị ọ kwesịrị ime gbasara ọnọdụ ahụike na steeti ahụ.

Ọ sị na a ka kwesịrị imetụ aka n'ihe gbasara "community health centers", na ọtụtụ n'ime ha enweghi ngwaọrụ nke ha ji enwe ndị na-arụ ebe ahụ, mere na ụfọdụ oge ị garuo ebe ahụ ị hụ na a gbachiri ha agbachi.

N'agụmakwụkwọ:

Ọ rụọla ụlọakwụkwọ maka ndị chọrọ ịbụ nọọsụ nke dịkwa n'Uburu.

Ọzọ bụ na Umahi chọrọ ikpokọta ụfọdụ ngalaba dị na kọleji dị iche iche na steeti ahụ (ọ dị anọ), mee ka jiri ebe abụọ mere ụlọakwụkwọ.

Anioke kwukwara na ọ na-agbalị imezi ụlọakwụkwọ praịmarị ndị nke a rụburu arụ.

Nchekwa:

N'ihe gbasara nchekwa, Anioke kwuru na Ebonyi bụ otu steeti ihe gbasara ohi na mpụ na-agbada, kama na ọrụ nchekwa bụ ihe dịrị mmadụ niile na-abụghị naanị gọvanọ.

O kwuru na gọọmentị Umahi wepụtara ihe a na-akpọ "neighbourhood watch" ga-etinye anya na nchekwa, ma tinyekwara nke ọhụrụ a chọrọ imalite ugbua bụ nke a kpọrọ "community policing".

O kwuru na ihe gbasara okeala ndị Ebonyi na Benue na Krọs Riva na-ebutekarị okwu na ogbugbu mmadụ, na isiokwu ya sitere n'ihe gbasara nkewapụta steeti mgbe e kewapụtara steeti ọhụrụ.

O kwuru na ọ bụ okwu malitere tupu Umahi abata, mana ọ nwaala ike ya ịhụ na okwu gbasara ọzụzọ okeala biri.

Ọdịmma ndị ọrụ Bekee:

N'ihe gbasara ọdịmma ndị ọrụ Bekee, Anioke sị na ebe a bụ otu ebe ọ na-agahị ajanwu Umahi mma.

O kwuru na "A na-ekwu na Ebonyi steeti so na steeti ebe ụgwọ ọnwa a na-akwụ ndị nkuzi kacha pee mpe."

Ọzọ bụ na o kwuru na Ebonyi amalitebeghi ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe gọọmentị etiti tinyere n'iwu ka a na-akwụ ndị ọrụ.

Lee ihe ndị na-eso BBC Igbo kwuru na gọvanọ ndị a merela na steeti ha:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Democracy day: Kedụ etu i si hụta ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa?