Ebonyi Killings: Ndị ọnụ na-eru n'okwu na Mgbo ma ndị aka ha dị ogbugbu mmadụ na Mgbo - Dave Umahi

Gọv. Dave Umahi nke Ebonyi steeti

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT

Nkọwa foto, Gọv. Dave Umahi nke Ebonyi steeti

Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti enyele ikike ka ndị uweojii nyochaa ndị niile ọnụ na eru n'okwu bụ ndị ọ na-ebo na ha ma maka ọgbaghara dara na Ngbo dị n'Okpuruọchịchị Ohaukwu na agbataobi ha bụ Agila nke Benue steeti.

Dịka Ọdeakwụkwọ mgbasa ozi ya siri kwuo "Gọvanọ enyela ikike ka enyocha mmadụ iri abụọ na anọ bụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na okpuruọchịchị ahụ."

O teela aka ndị Ngbo n'Ebonyi steeti na ndị Agila nke Benue steeti zọwara ala.

Nke a mechere ka gọmentị steeti abụọ ndị a hibechere kọmit udo atọ nke ga-ahụ na ya bụ ndọrọdọrọ ala bụ nke tagoro isi ọtụtụ mmadụ bụ ihe ga-abịa na ngwucha.

Osote Gọvanọ ndị Benue bụ Benson Abounu na ogbo ya nke Ebonyi steeti bụ Kelechi Igwe hibere kọmiti a n'izu gara aga.

Agbanyeghị nke a, ọgụ ka na aga n'ihu na obodo abụọ a bụ nke lagoro ọtụtụ ndụ na akụ na ụba ndị mmadụ n'iyi.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Loveth Oda sị na ya enwetebeghị nke bụ eziokwu maka okwu a mgbe anyi dere akụkọ a.

Akụkọ kọrọ na mmadụ anọ ndị a e gburu sọ na kọmiti udo .

O nwebeghị onye ma ndị aka ha dị na ọchụ a egburu.

Akụkọ ga-amasị gi