PDP Ebonyi rally: Ndị Awụsa bi Ebonyi steeti soro pụta ịkwado Atiku na Obi
Dịka Atiku Abubakar , onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP gara ọsọ achumta vootu n'Ebonyi steeti ụbọchị Fraide, ndị Awụsa nọ n'steeti ahụ pụtara n'ụzọ ụzọ ikwado ya.
Ndị Awụsa karịrị narị anọ n'ọnụ ọgụgụ gbakọrọ n'Unity Square Abakaliki were egwuregwu na ihe ngosi dị iche iche na-egosiputa nkwado ha n'ebe Atiku Abubakar na Peter Obi nke PDP nọ.
Ha kọwara na ha na-ebi n'udo kemgbe ha bịara n'obodo ahụ.Onyeisi ndị 'Hausa Pilgrim Board Ebonyi state' bụ Alhaji Issa Yinusa kọwara na asụsụ igbo na Kemgbe ọtụtụ afọ gara aga ha bi na steeti ahụ ndị Awụsa maọbụ Fulani enwebeghị nsogbu ọbụla.
Yinusa kwere nkwa na ọ bụ Atiku na Peter Obi ka ha ga-atinyere akwụkwọ ntuliaka.
Lee ihe ha gwara BBC Igbo n'ihe nkiri a:


