Atiku's Endorsement: Onweghi ihe Buhari ga-eme Igbo ga-aka nke o merela - Nnia Nwodo
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo kwuru na ntuliaka 2019 bụ mgba dimkpa abụọ na-agba.
Ha hara otu onye n'ime ha na-ekwu ihe Ndigbo kwenyere na ya bụ nhazigharị Naijiria nke a kpọrọ, ‘Restructuring’, na bekee.
Nwodo kwuru na e nwe nhazigharị Naijiria, Ndigbo agaghị na-achọ ọrụ ahapụ Alaigbo n’ihi na a ga-enwe ọganihu dịka ọ dị gboo oge e nwere ọchịchị na mpaghara, na mpaghara.
“Anyị nwe restructuring, ị gaghị hapụ Alaigbo gawa ebe ọzọ ịchọ ọrụ."
O kwuru na n’agbanyeghị na APC kwere nkwa ihazighari Naijiria tupu ha abanye n’ọchịchị, o nweghị ihe Buhari mere iji weta ya na mmezu.
“Ọ kpọghị Constitutional conference ka a kpa etu aga esi mee restructuring.”
N’okwu na Peter Obi agaghị enwe ikike ọbụla dịka osote onyeisiala, ọ kọwara n’iwu Naijiria na osote onyeisiala bụ onyeisi nhazị akụnaụba.
Gee ihe o kwuru n’uju: