A tụhapụla onyeisioche APC n'Abia

Uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A tọọrọ Nwamkpa na mgbede ụbọchị onyeisiala gara Abia maka achụm nta vootu.

Onụ na-ekwuru uweojii n'Abịa steeti bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC Igbo na Donatus Nwamkpa bụ onyeisioche pati APC n'Abia steeti nọzi n'ụlọ ọgwụ ezuike.

O sị na aka ejidebeghi ndị a tọọrọ nwoke ahụ, ma na ha nọ́ esosi ha n'ike.

A tọọrọ Nwamkpa n'ụzọ korota Aba dị n'Isialangwa, n'elekere itoolu nke mgbede ụbochị Jenụwarị iri abụọ na itoolu.

Amabeghị ma akwuwu ụgwọ iji napụta Donatus Nwamkpa n'aka ndi ji ya.

Itọọrọ mmadụ bu ihe na-eme ugboro kwa ugboro na Naịjirịa. Ọtụtu mgbe, akwụọ ọgwọ, ahapụ onye eji.

Akụkọ ka n'abịa.