Amnesty to Looters: Oka mma karịa ị na-egbu oge n'ụlọikpe - Ndị ọkaiwu

Atiku Abubakar

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọkaiwu na ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ọwụwa-anyanwụ ekwuola na atụmatụ ịgbaghara ndị zuru ego ma ha weghachi ego ha zuru ga-enye ohere ka Naijiria nweta ego gọọmenti e zuru ezu ọsịsọ.

Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'okpuru PDP kwuru n'oge mkparịtaụka a kpọrọ "The Candidates" nke ụlọakụkọ NTA mere kwuru a ga-esi ụzọ a nata nde kwuru nde Naira ego ezupuru n'akpaego Naijiria.

Ọkaiwu Anthony Okah kwuru na ikpe ndị a na-ekpe ikpe na ha zuru ego Naijiria na-anọ afọ ise, iri na enweghị onye a natanwuru ego.

Okah gara n'ihu kwụọ na "ọ ga-eme ka a nata ego ozuru ezu ọsịsọ."

N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Ben Igweenyi kwuru na "O nweghị ihe dị njọ" na ya bụ atụmatụ.

O kwuru na a na-eme ya, e tinyekwara ya ụzọ ndị ọsọ na-alụ ọgụ megide nrụrụaka.

Aha onyonyo, Amnesty for looters: Jonathan mere ya, Buhari mekwara ya

Ọkachamara n'ihe gbasara okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Chunonye Okereke kwuru na atụmatụ ahụ nke ọ kpọrọ "plea bargain" ga-enye aka napụta ndị zuru ego Naijiria ihe ha zuru na-egbughị oge, nakwa na- emefughị ego a na-emefu na-ikpegharị ikpe n'ụlọikpe.

Okereke kọwara na ihe Atiku kwuru abụghị ihe ọhụrụ n'ihi na Goodluck Jonathan na Muhammadu Buhari mere ya.

Akụkọ ga-amasị gị: