Nnamani, Egwu enwetala ikike ịga sineti n'aha pati ha

Chimaraoke Nnamani ji vootu 583 were merie n'ịzọ ọkwa onye ga-anọchite Enugu East zone n'ụlọoimeiwu ebe Chinedu Nnewi ,onye nwetara vootu 80 nakwa Nkwuo Ngene onye nwetara vootu 70 na ntuliaka ndị PDP mere n'Enugwu steeti.
Sam Egwu bụ naanị onye zọrọ ọkwa ịnọchite Ebonyi-North na Sineti n'aha PDP na ntuliaka imeụlọ ha mere n'Ebonyi steeti.
Aka chịburu Abia bụ Theodore Orji nwetakwara ikike ịnọchite Abia-Sentralụ ọzọ na ntuliaka imeụlọ PDP mere n' Umuahia, ebe Enyinnaya Abaribe, na Mao Ohuabunwa nwetakwara nke Abia South nakwa Abia-North na ntuliaka imeụlọ PDP mere Aba na Ohafia.

Ebe foto si, Facebook
N'aka nke ọzọ, aka na-achị Nasarawa steeti bụ Umaru Al-Makura nwetara ikike otu APC ịnọchite Nasarawa- South na sineti n'afọ 2019.
George Akume, onye bụbu gọvanọ Benue nwetakwara ikike APC ịzọ ọkwa ịnochite Benue North-West n'ụlọomeiwu ukwu.
O nweghị onye ya na Akume onye garala ije ugboro anọ zọrọ ọkwa ahụ.
Ọ na-achọ ịghọ omenala na ndị biburu Gọvanọ na-aga ụlọomeiwu ụkwu ezumike nka.
Cheta na Rabiu Kwakwanso sinetọ na-anochite Kano-Sentralụ bụbu gọvanọ Kano steeti, Godswill Akpabio bụbu Gọvanọ Akwa-Ibom, ebe Bukola Saraki bụbụ gọvanọ Kwara steeti..
Akụkọ ga-amasị gị:









