Akụkọ dị mkpa taa: PDP n'Enugwu kwu Ekweremadu n'azụ
Akụkọ dị mkpa taa

Ebe foto si, Getty Images
Osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu ewerela ikike PDP ịzọ oche Enugwu West na ntuliaka afọ 2019.
Ndị so ya n'azụ bụ uche Onyekwulu, Oscar Egwuonwu na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Ambode
Gọvanọ na-achị Lagos steeti bụ Akinwunmi Ambode ejirila ugwu nara mmeri emeriri ya na ntụlịaka imeụlọ APC mere na Legọsn'ụbọchị abụọ nke okotoba.
O ziri ozi gwa ndị Legọs ha jisike kwado otu APC n'udo na ntuliaka na-abịa.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, AFP
Na mba Congo ndị mmadụ awakpoola ndị ọrụ ahụike mgbe ha na-akwado ili ozu ndị nwụrụ site n'ọrịa Ebola.
Ndị obodo ahụ mere ihe a n'ihi na ha-ekwenyeghi na ọrịa Ebola bụ ọrịa ziri ezi.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Otu egwuregwu nke Raja Casablanca agbaala Enyimba nke Abia otu goolu asataghị otu mgbe ha zutere onwe ha taa n'asọmpị Confederation of African football.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ebe otu Rangers ji ọkpụ anọ asatara abụọ merie Akwa United mgbe ha kwatara ya na Kano taa
Gee Nkeji nke mgbede
N'ụtụtụ,
Uche Ogah ga-eburu APC Ọkọrọtọ n'Abia

Dịka ntuliaka imeọnụ na-aga n'ihu na pati dị iche iche, Uche Ọga apụtala dịka onye ga-azọrọ APC ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti n'afọ 2019.
N'otu aka ahụ, Bernard Ifeanyi pụtara ịzọ ọkwa gọvanọ na pati APC n'Ebonyi steeti ekwuola na ntuliaka emere ebe ahụ juputara na mpụ na aghụghọ.
Ogar nwetara vootu 86875 iji merie mmadụ isi ndị ọzọ zọsịrị ya ọchịchị.
Onye kpọrọ mpụta ntuliaka a bụ onyeisi kọmiti na-ahazi ntuliaka ahụ bụ David Iyoha.
Etu ndị ndọrọndọ ndị ọzọ si kwuru bụ:
Ikechi Emenike (455), Chris Akomas (2123), Martins Azubuike (10889), Friday Nwosu (3529), Okey Emeuche (1270) na Paul Ikonne (999).
ọ bụ sọsọ Uche Ogar na Okey Emeuche no mgbe agụrụ vootu a.
Ọgụ ọzọ adawala na Jọs

Ebe foto si, Getty Images
Ọgu na-ada na Jos, isi obodo Plateau steeti ataara isi ihe ruru mmadu iri.
Ọgu a bidoro kemgbe Fraide nke izu uka gara aga ruo unyaahu. ụlọ ụka alakụba na nke kristi so na akunauba oku tara n'ọgbaghara a.
Ọstrelịa ga-achụ Kansa ọsọ ụkwụ erụala

Ebe foto si, Cancer Council Australia
N'ofesi, mba Ọstreria eturula ugo dịka mba mbụ ga-ememina ọrịa kansa ọkpụkpụ ugwu nke akpọrọ Cervical Cancer na supirisupiri.
Mba ahụ rụpụtara ọgwụ mgbochi nke ga-achụ ya bụ ọrịa ọsọ ụkwụ erụala n'afọ ịrị abụọ na-abịa.
N'egwuruegwu, akwaala otu Manchester United emu

Ebe foto si, Getty Images
Na Champions League, Manchester United eritaghi elele na obi ha ka ha na Valencia ji efu efu mechie asọmpị ha.
Mana, ogbo ha bụ Manchester City ji ọkpụ abụọ asatara otu lee onwe ha ọbịa na be ndị Hoffenheim.
Lee ihe nkiri anyị











