Saraki: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya ịzọ ọkwa onyeisiala.

Bukola Saraki

Ebe foto si, @bukolasaraki

Nkọwa foto, Bukola Saraki si na Pati APC banye na PDP na nsonso a
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye ọkammụta n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchichị bụ Samuel Olisa kwuru na mkpebi Saraki ịzọ oche onyeisiala diri ọchịchị onyekwuoucheya na Naịjirịa mma.

Mana Olisa kwuru na Saraki agaghị emeri na ntuliaka imeụlọ maka na Kwankwaso bụ aka chiburu Kano steeti ka ewu ewu n'Ugwu Awụsa.

Olisa kwukwara na o cheghị na Saraki ga-agba arụkwaghịm ugbua o kwuputara ebumnuche ya gbasara ịzọ ọkwa onyeisiala.

Iji maa atụ, o kwuru na onyeisiala aetinyeghị akwụkwọ arụkwaghị oge o kwupụtara na ya ga-azọ ọkwa onyeisala ọzọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na nsogbu niile Saraki ga-emeri na nsogbu niile ọ na-agabịga ugbua dika onyeisi ụlọomeiwu.

Cheta na Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki kwupụtere taa na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala na 2019.

O kwupụtara nke a n'Abuja n'ọgbakọ ya na ndị ntorobia chọrọ ịzọ ọchịchị nwere taa bụ Tọọsde.

Saraki tụrụ arịrị na oke agụ, ọnọdụ akụnaụba Naijiria nke kprula afọ n'ala nakwa nsogbu nchekwa bụcha nsogbuchere Naijiria aka mgba, sị na ọ bụ ihe ndị a ka ọ lechara anya were sị ka ọ za oku ndị na-eto eto na akpọ ya ịzọ ọkwa onyeisiala.

" Ọ bụ n'ihi ihe ndị a ka m jiri na-ekwupụta ebumnobi m ịzọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka na-abịa na 2019 n'otu parti PDP."

Ihe ndi mmadu na-ekwu na Soshal midia maka mkpebi a:

@babaidris090 kwuru na ọ nabatara mkpebi Saraki dika iheoma.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@adeoludada2003 kwuru na Saraki azọpụtaghịnwụ ndị Kwara steeti ma ya fọrọ ịzọpụta ụmụ Naịjirịa.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@seguntomori nabatara ya bụ mkpebi mana na-ayọ Saraki ka o lebanya na ahụhụ ndị odibo omeiwu na-ata.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụkọ ndị ga-amasị gị: