Lee ndị akpụpụrụ ụlọikpe maka Saraki
Ha ekpeela DSS, ndị uweojii, Sineet na ọkaiwu ukwu Naịjirịa n'ụlọikpe maka Saraki

Ebe foto si, Getty Images
Ndị omeiwu ukwu abụọ aha ha bụ Rafiu Adebayo na Isa Misau akpụpụla ọkaiwu ukwu Naịjirịa, ndị uweoji, DSS, Sineet na mmadụ asaa ndị ọzọ maka ị kwụsị echiche ọbụla gbasara ị chụda Saraki dịka onyeisi ndị omeiwu ukwu.
Ndị kpuruisi emeela ngagharị iwe n'Imo

Ebe foto si, Getty Images
N'Imo steeti, ndị kpuru isi na-agụ akwụkwọ na Mahadum nakwa ndị otu ha gwụchasịrị akwụkwọ Mahadum mere nghagharị iwe n'Owere n'ihu ụlọọrụ ọchịchị gọọmentị.
Iwe ha bụ na gọọmentị akwụbeghị ego gbata gbata ha dịka e kwere ha na nkwa.
Soumaila Cisse na-akwado mgba

Ebe foto si, Getty Images
Na mba Mali, onye na-azọ ọkwa dịka onyeisiala n'ime paati nke na-anọghị n'ọchịchị bụ Soumaila Cisse ekwuola na ya agaghị anabata mkpebi kwuru na Ibrahim Boubacar Keïta bụ onyeisiala Mali bụ onye meri na ntuliaka ala ahụ.
Ugbua, Cisse na-akpọ ndị na-akwado ya ka ha bido nghagharị iwe ngwa ngwa.
Samuel Eto agaala Qatar

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ n'ekwu na Samuel Eto ga-aba otu egwuregwu Qatar SC na-efu.
Gee nkeji anyị n'ụtụtụ a
Lee ihe nkiri anyị











