Osinbajo na Saraki enwela nzụko ka uweojii kagbụrụ oku ha kpọrọ ya

Ebe foto si, Getty Images
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo na onyeisi ndị omeiwu Naịjirịa bụ Olusola Saraki na ndị isi ndị uweojii enwela nzuko n'Abuja.
Ndị ọkachamara n'ihe metụtara ndị gọọmentị Naịjirịa na-akọwa na o bụ maka nsogbu dị n'etiti onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris na Saraki ka Osinbajo jiri kpọọ nzụkọ a.
Cheta na ndị uweojii kpọrọ Saraki ka ọ bịa zaa ọnụ ya maka ebubo ndị uweojii sị na ha bu omekome kpara arụ na Offa, bụ ebe ha gburu mmadu ruru 33.
Chetakwa na n'ime izuụka abụo gara ihe na-ewu bụ oku Saraki na ndị otu ya n'ụlo omeiwu ukwu kpọrọ Ibrahim Idris maka "ọgbaghara dị na Naịjirịa na okwu Dino Melaye".
Idris ekweghi ịza oku ahụ, mana ọzịgara osote ya, nke ndị omeiwu jụrụ ị nabata.
Ka akụkọ nzụkọ osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo na ndị a na-eme ka na-apụta, Saraki dere na ndị uweojii ederela ya akwụkwọ sị ya hapụ ịbịa ụlọọrụ ha, kama ka ọ zara ọnụ ya n'usoro edemede.
O kwukwara na ya ga eme otu a ha kwuru:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana ka nke ahụ na-eme, ndị akpọrọ nPDP, bụ ndị si otu Peoples Democratic Party (PDP) bata otu pati na-achi bụ All Progressives Congress (APC) kwuru na ha agaghịzị ị ga nzụkọ ha na osote onyeisiala nwere tata. Nzụkọ ahu bụbu maka ị nụrụ ma ị sa ihe ụfọdụ na-ewute ndị nPDP.
Ndị nPDP kwuru na ọ bụ mmegide ha chere na a na-eme Saraki na Abdulfatah mere ha jiri kagbuo nzụko a.









