Yemi Osinbajo: Etu ndị Anambra siri nabata ya n'Eke Awka taa
Mgbe Osote onyeisiala gara Anambra

Ebe foto si, @Laoluakandeoj/Twitter
Osote onyeisiala bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo wụchiri n'ahịa Eke Awka nakwa Ọchanja ndị dị n'Anambra steeti iji maata etu usoro 'Tradermoni' si emetụta ndụ ndị na-azụ ahịa.
Na njem ahụ ọ gara, ọ gara leta Obi na-achị Ọnịcha bụ Igwe Alfre Achebe ịkwanyere ya ugwu.
Ọ malitere njem ya n'Enugwu steeti ebe aka na-achị steeti ahụ bụ Ifeanyi Ugwuanyi nabatara ya n'ọdọugboelu Akanu Ibiam.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nghagharịiwe a na-eme n'Algeria

Ebe foto si, AFP
"Anyị agaghị agbachi nkịtị" bụ ihe na-afịọ n'obodo Algeria dịka igwe mmadụ pụtara ịme ngagharịiwe maka ọchịchị nchịgbu n'ala ahụ.
Ha kwukwara na ha chọrọ ntuliaka ziri ezi nke ala ha tinyere n'ụbọchị 4 nke ọnwa Jụlai.
Akụkọ BBC Igbo na Nkeji
Ihe Ipob ziri ndị otu ha

Ebe foto si, Getty Images
Otu Ipob akpọkuola ndị otu ha nakwa ndị niile mkpamkpa ndị Boko Haram na ndị ọchịehi metụtara ka ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee.
Ha kwuru na ọ bụ jị ruo ụjụ maka ndị ọchị echi kwafuru ọ bara ha nakwa ndị niile e gburu na mbọ nweronwe Biafra.
Odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Emma Powerful sị na ụbọchị ahụ ka ha ga-eru uju maka ndị nwụrụ n'aka ndị Boko Haram nakwa ndị na-achị ehi.
Powerful sị na "a ga-amụ anya mbọmchi n'abalị bọtara ụbọchị ahụ n'ụka, mọsk nakwa sinagọgụ bụ ebe a ga-ekpe ekpere maka mkpụrụ obi ndị nwụru n'aka nwakpo ndị Boko Haram nakwa ndị gọọmenti".
A gbanyele onyeisiala mba New Zealand ọlaaka nkwa alụmdi

Ebe foto si, Hannah Peters
Enyi Jacinda Arden, Praim Mịnịsta mba New Zealand bụ Clarke Gayford agbanyela ọdịyanobi ọlaaka nkwa alụmdi.
Akụkọ na mmadụ abụọ mere nke a pụtara ka otu onye ntaakụkọ anya ya dị nkọ hụrụ ka ọla mgbuke na mkpịsịaka nke etiti Arden were jụọ ụlọọrụ ya maka ya.
Gayford na Arden zutere onwe ha mbụ n'afọ 2012 na mmemme inye nturuugo.

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuru ya were kwuo na ha mere emume ikwerịtara onwe ha nkwa n'oge mmemme 'Easter.'
Cheta na n'afọ gara aga, Arden mụrụ nwa mbụ ha.
Arden bụ nwaanyị na-achị mba abụọ na-amụ nwa ka ọ nọ n'ọkwa ọchịchị.
Onye mbụ mere nke a bụ Primae Mịnịsta chịị Pakistan Ugboro abụọ bụ Benazir Bhutto nwụrụ anwụ.
Rochas Okorocha: Anyị ga-agbaso mkpebi ụlọikpe- Inec

Ebe foto si, Facebook/Rochas
Inec ekwuola na ha ga-enwe ọgbakọ iji lebanye anya na mkpesa ọhụrụ nke Rochas Okorocha detara ha maka njichi ha jichiri asambodo mmeri ya.
Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha kwusiri ike na akwụkwọ o degaara onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu na nso nso a sị na Inec enweghị ike ịnapụ ya mmeri o meriri na ntuliaka e mere n'ọnwa Maachi ma kpọọ oku ka ha nye ya asambodo ahụ.
Na nzaghachi, ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru na ndị isi ụlọọrụ ha ga-atụnye ọnụ n'okwu ahụ n'ọgbakọ ha ga-enwe n'izu ọzọ.
"Onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu bụ onye Okorocha degara akwụkwọ anọghị n'ụlọ. Ọ gara alabekee. Ọ lọta, anyi ga-enwe nzụkọ banyere mkpesa ahụ Rochas wetara."

Ebe foto si, Festus Okoye
Mgbe BBC jụrụ ya na nzụkọ ahụ apụtara na a ga-ewepụta okwu ahụ n'ụlọikpe ebe ọ nọ ugbua, Okoye kwuru sị:
" A ga ahapụ okwu ụlọikpe ka ọ gaa ka o siri kwesị." Ọ bụrụ na ụlọikpe si ka anyị nye ya akwụkwọ anyị enye ya.
"Ụlọikpe sị anyị enyela ya anyị agaghị enye ya."
"Ọ bụ mkpebi ụlọikpe ka anyị ga -agbaso."
EFCC na ndị Yahoo n'Owerri

Ebe foto si, EFCC
EFCC anwuchiela mmadụ iri atọ na asaa bụ ndị ha sị bụ ndị Yahoo Yahoo na Owerri.
Nke a mere ka a gbachara ha ama maka ụdị okoko ndụ ndị ahụ na-ebi n'Okwu Urata, Aladinma nakwa Egbu nke dị n'Owerri, Imo steeti.
Facebook Amachiela mmadụ atọ

Ebe foto si, AFP/Getty
Nwanna a, ị ma na Facebook nwere ike ịmachị gị ma ị zipu ozi nwere ike ịbute ọgbaaghara?
Facebook machiri Milo Yiannopoulous, Alex Jones na Louis Farakhan bụ ndị ha sị na ha na-ezipu ajọọ ozi nwere ike ibute ọgbaaghara n'ụwa.
Arsenal meriri Valencia 3- 1

Ebe foto si, Getty Images
Arsenal azaala odogwu n'asọmpị ha na ndị Valencia ụnyahụ bụ ebe ha ji ọkpụ atọ asatara otu nyụọ ha anya.
Mmeri a mere ka Arsenal manye otu ụkwụ na agba nke ikpeazụ na egwuruegwu Europa League.









