Ụgbọelu osote onyeisiala enweela nsogbu n'elu

Ebe foto si, Yemi Osibanjo/Twitter
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo gbanahụrụ ọdachị ụnyaahu ka ụgbọelu bu ya ga-ụlọakwụkọ akpọrọ Nigerian Customs Command and Staff College nke dị na Gwagwalada nwere nsogbu n'elu.
Ụgbọelu a, bụ nke a na-akpọ "helicopter" ebuchịghị ya azụ n'Abuja.
Osinbajo gara ụlọakwụkwọ Customs ahụ bụ ebe a na-azụ ndị ọrụ ngalaba na hụ maka ụtụisi na ngwa ahịa na-abata Naịjirịa.
Osinbajo na ndị pụtara na-agụmakwụkwọ sere foto tupu ọ gawa ebe ụgbọelu ya dị, mana ka ụgbọelu ahu fepụrụ, achọpụtara na-ụme adịghịzị ya ị naru.
Osote onyeisiala mechara jiri ụgbọala lawa, ka ahapuru ụgbọelu ahu ebe ahụ.
Onye mgbasa ozi Osinbajo bụ Laolu Akande kwuru na ọ bu ihe mebiri na ya bụ ụgbọelu mere osote onyeisiala jiri hapụ iji ụgbọelu ya la.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:



























