Njem Buharị na Legọs: Ndị njem ụgbọelu tọrọ atọ na Legọs

Ndị njem
Nkọwa foto, Emechiri ụgbọala ịgba n'okporoụzọ ụfọdụ maka ọbịbịa onyeisiala Muhammadu Buhari na Lagos steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọtụtụ ndị njem ụgbọelu ji ụkwụ gaa ibanye ụgbọelụ n'ụzụ ụtụtụ taa dịka e mechiri okporoụzọ na-aga ọdọụgbọelu nke ụlọ na nke mba ofesi na Legọs n'ụtụtụ taa.

A na-ele anya na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-abịa isi obodo Legọs maka mmepe ọdọụgbọala, ga-erute n'ọdọụgbọelu ahụ n'elekere nke iri na otu nke ụtụtụ a.

N'ihi mkpọchi akpochiri ọtụtụ ụzọ, ndị mmadụ ji kwu ga ihe karịrị nkeji iri atọ maọbụ otu elekere tupu ha eruo ebe ndị na-abanye ụgbọelụ na-anọ.

Mmechị a nke bidoro ụnyaahụ, dịka ndị njem siri kwuo, mekwara na ndị sị mba ọzọ febata n'ọdọụgboelu Legọs na-eji ụkwụ ga ogologo ije tupu ha erute ebe ha ga-abanye ụgbọ ga-akwọga ha ebe ha na-aga.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-egosi iwe ha na mkpọchị akpọchiri ezi na ụzọ na Lagos maka ọbịbia onyeisiala n'elu igwe okwu, Twitter.

Henry Okelue kwuru: "Aghọtaghị m ihe mere e jiri mechie Legos maka njem onyeisiala. O bi n'Abuja na-agagharị n'etiti anyị kwa oge ma onwebeghị oge emechiri ya ọbụladị otu ụbọchị."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Inibehie Effiong kwuru : "E mechie Legos maka njem Buhari. Ndị amala enweghị ike ịgagharị. Egbosara njem ụgbọelụ. E kweghị ka ụgbọala ga n'okporo ụzọ banyere ọdọ ụgbọelu. E mechiri ọrụ ndọ ọrụ boyibo. Ma gị asị na isi dị ndị ndu anyị mma?"

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

A na-ekwukwa na steeti Legọs ga-efu ihe ruru ijeri naịra 200 maka mmechi emechiri ahịa na ebe ndị ọzọ maka njem onyeisiala na-eme.

Onyeisiala ga-anọ mkpụrụ ụbọchị abụọ na Legọs dịka ọ ga-emepe ọdọụgbọala a rụrụ ọhụụ na Legọs.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị: