Ụgbọelu bu mmadụ 60 akpọkasịala na Iran

Ebe foto si, KONSTANTIN VON WEDELSTAEDT
Ụgbọelu bu ihe ruru mmadụ 16 a kpọkasịala n'ebe ugwu dị na sentral Iran, dịka ntaakụkọ kwuru.
Ụgbọelu a dara n'ugwu Zagros dị nso obodo Semirom dị na mpaghara Isfahan, ka ọ na-efe n'etiti Tehran na ọdịda-anyanwụ obodo Yasuj, dịka akụkọ kwuru.
"Ndị ọrụ gbatagbata niile mụ anya na-eche" otu ọnụ na-ekwuchitere ndị ọrụ gbatagbata kwuru. "Ụgbọelu ahụ bu ndị njem ruru 50 maọbụ 60."
Akụkọ kwuru sị na ọ bụ ihuigwe ọjọọ gbochiri helịkọpta ndị gbatagbata ịgaru ebe ahụ.
Ọ bụ ndị Aseman Airlines nwe ụgbọelu ahụ a sị na ọ bụ ATR 72-500.
Akụkọ kwuru sị na ndị njem 60, ndị nchekwa abụọ, ndị na-elekọta ndị njem n'ụgbọelu abụọ nakwa mmadụ abụọ na-anya ụgbọelu.
Mmadụ niile nọ na ụgbọelu a anwụrụ.






