Anyị a machịghị ndị ọchi ehi bi n'Ebonyi - Uweojii

Onye na-achị ehi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onwere ihe ga-akwụsị mkpamkpa gbasara ịchị ehi?

Ọnụ na-ekwuchịrị ndị uwe oji n'Ebonyi steeti bụ Odah Loveth ekwuola n'iwu mmachị govanọ David Umah mere n'Ebonyi steetị maka ndị na-achị ehi anaghị emetuta ndị ọchị ehi bi bu n'Ebonyi.

O kwuru na iwu nke a ga-emetụta ndị ochị ehi na-esi steeti ọzọ abata Ebonyi.

Oduah kwuru na "Ọkwa ị ma na Ebonyi na Benue na-eke ofu oke? Ndị na achị ehi n'Ebonyi gwara anyi na ndị a na-ebute mkpamkpa bụ ndị sị obodo ọzọ abata"

Odua kwukwara na ha na-echebido ha na oke Ebonyi na obodo ndị ọzọ.

Lee steeti di icheiche nwere mmachị ochi ehi

Aha onyonyo, Mmachị ọchị ehi

BBC Igbo kpọrọ ụfọdụ mmadụ bị n'ala igbo maka mmachị nke a, n'ajụkwa ma onwere ihe dị iche ga-apụta n'iwu nkea?

Otu Obiahu bi n'Afikpo na Ebonyi steeti, gwara BBC Igbo na ka mgbe ndị na-achị ehi bidoro ọgụ, ụjọ abago onye ọbụla n'ahụ.

"Oteela anyị na ndị n'achị ehi n'ebi n'udo n'Ebonyi. Anyi amaghị ihe mere ọgụ nke a bido," Obiahu kwuru.

Jenkins Eni bụ onye ọzọ bi n'Asaba, Delta steeti gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ ga-adịnma ka steeti ọbụla n'ala igbo tinye iwu a maka na ihe ehi ha na-eri bụ ihe ndị ọrụ ugbo ji afụfụ were kpata.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: