Buhari: O mere nkwugheri n'ọgbakọ UNGA nke 74?

Ebe foto si, Buhari's Twitter Handle
Kamgbe onyeisiala Muhammadu Buhari kwuputechara ebumnobi ya n'ọgbakọ United Nations nke ugboro iri asaa na anọ, ndị mmadụ gara na twitter na-akatọ ya.
Nke a mere ka aha ya na-ewu na twitter.
Ụfodụ ụmụ Naịjirịa na-ekwu na ọ zataghị ajụjụ ajụrụ ya n'ọgbakọ ahụ gbasara ndị ntorobịa na ihe o na-eme maka ọdịnihu ha.
@Chiamak06282806 kwuru na ajụjụ ahụ agbasaghị mgbanwe eluigwe na ndị ntorobịa
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@ArabOfficial_ na-ajụ ihe mere Buhari ji kwado ihe ọ ga-ekwu na-adabaghị n'ajụjụ ajụrụ ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mana mmadụ dịka:
@WAHAB_OLATUNJI kwuru na onye wepụtara onyonyo ahụ na-alafụ ndị mmadụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Buhari o mere nkwugheri?
Nke mbụ bụ na ọgbakọ ebe ọ zara ajụjụ ahụ bụ nke a na-akpa maka ihu mbara igwe nke mere ka ajụọ ya ajụjụ gbasara isiokwu ọgbakọ ahụ bụ (Climate Action Summit 2019) dịka anyị sị chọpụta.
Ka o si zaa ajụjụ a
Ihe nkiri a na-efegharị n'elu twitter na-egosi ebe Buhari sara ya bụ ajụjụ mana @renoomokri kwuru na tupu onye enyemaka onyeisiala Buhari ewepu ya bụ ihe nkiri , na ya setere ya na foto.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Mana lee ka onyeisiala Buhari si depụta ọsịsa ya na Twitter ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Lee ihe ise gbara ọkpụrụkpụ onyeisiala Buhari kwuru n'ọgbakọ ahụ.
1.Ụbiam
Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na dịka ụwa na-abawanye n'akụ na ụba, nde kwuru nde ụmụ Naịjirịa nọ n'ụbịam.
O kwuru na ụbịam bụ otu nnukwute nsogbu ụwa ka na-enwe rue ugbua.
O kwuru na ya na ndị otu ya ewepụtala atụmaatụ akpọrọ National Social Investment Programme nke na-enyere ndị ụbịam nọ na Naịjirịa aka.
2.Ime ka onye ọbụla soro n'ihe a na-eme
O kwuru na atụmaatụ a bụ maka ime ka onye ọbụla nọ na Naịjirịa tụmaadị ụmụnwaanyị na ntoroọbịa sonye n'ọchịchị , okwu gbasara mgbanwe ihu igwe nakwa ọrụ ugbo.
3.Mgbanwe Ihu eligwe
Buhari kwuru na Naịjiria na mba ofesi kwụ ma abịa n'ihe gbasara irube isi na nkwekọrịta imedata anwụrụ ọkụ ha binyere aka n'afọ 2015.
4.Agụmakwụkwọ
Gbasara ime ka onye ọbụla gaa akwụkwọ na Naịjirịa , Buhari kwuru na ọchịchị ya wepụtara atụmaatụ akpọrọ "Home Grown Feeding Programme" iji we me ka ụmụaka na-achọghị ịga akwụkwọ pụta n'uju ma mee kwa ka ọ dịrị nne na ha mfe ịtinye ha n'ụlọakwụkwọ.
5.Mmerụaka
O kwuru na Naịjirịa ka na-enwe ezigbo nsogbu n'ichipia ajọ agwa a.
O ji ohere ahụ chie ndị na-eji aha Naịjirịa were eme mpụ na aghụghọ tụmaadị ngalaba a na-akpọ P&ID.
Buhari rịọrọ ndị technụzụ ka ha mee ihe ha nwereike ime ịkwụsị ndị na-ebụ akụkọ ụgha n'elu soshal midia.
Buhari kwuru na ọ ga-adị mma ka ndị ọchịchị mbaụwa niile jịkọta aka n'ibuso mmerụka na mpụ agha dịka si buso ibu ọgwụ ike, ndị oyi egwu nakwa ịtụ mgbere mmadụ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị








