UNGA: Onye bụ Tijjani Bande?

Ebe foto si, María Fernanda Espinosa Garcés/Twitter
Nke chi bọkwụtere ụnyahụ bụ na Naịjirịa abụrụla ndị nchịkọta nzụkọ UN bụ United Nations General Assembly.
Onye ọ dara n'ubu ya bụ ọkamụta Tijjani Bande bụ onye nchịkọta nzụkọ UN nke iri asaa na anọ (74) bụ nke ga-amalite n'ọnwa Septemba 2019.
Ihe ndị a ka ị kwesiri ịma maka ya bụ nwaamadị nke María Fernanda Espinosa Garcés, onye nchịkọta nke na-apụapụ kpọpụtara ụnyahụ n'Abụja.
- A mụrụ Tijjani Bande na Zagga nke dị na Kebbi steeti n'afọ 1957.
- O ji nzere "political science" nke Ahmadu Bello University, Nigeria (1979)
- O nwetekwara nzere Mastasi na "Political Science", na Boston University, USA (1981)
- Were wee nzere PhD na "Political Science" nke Mahadum Toronto, Canada ebe ọ nọ kapịa ya ọnụ n'afọ 1987.
- Ọ malitere ọrụ nkụzị na Usmanu Danfodiyo University, Sokoto dịka "Graduate Assistant" n'afọ 1980
- N'afọ 2010 ruo 2016 Bande bụ onyeisi National Institute for Policy and Strategic Studies.
- Ọ rụrụ ọrụ ka onye nọchịta anya enweghị mgbanwe nke Naịjirịa na UN bụ ebe ọ bụ osote onye nchịkọta nzụkọ ahụ.
- O nwetakwara nturu ugo dị iche iche dị ka "Officer of the Order of the Federal Republic (OFR)"
Gịnị bụ Onye nchịkọta UN "General Assembly?"
Ọnọdụ nchịkọta nzụkọ UN "general assembly" bụ ọkwa onye na-achịkọta nzụkọ n'United Nation.
A na-ebugharị ọkwa a kwa afọ sịte na obodo ga obodo.
Okwa a anaghị erụ mba nwere agba dịka US, China, Canada na ndị ọzọ aka.
Mba ọbụla sọ na nzụkọ nchekwa enweghị mgbanwe na UN agaghị esi ọkwa ahụ imi.

Ebe foto si, Gertty Images












