World War 1: Etu agha a si metụta Afịrịka

Ngwa agha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Uwa niile enweela nkpebi na udi agha agaghị amalite ọzọ

Ụwa niile jiri taa bụ Nuvemba 11, 2018 cheta otu narị afọ ka mgbe a lụrụ agha mba ụwa nke mbụ.

N'ime nyocha BBC mere achọpụtara na mmadụ nkịtị ruru nde iri (10m) bụ ndị nwụrụ n'agha.

Ha chọpụtakwa na ndị agha ruru nde 9.7 sị mba dị iche iche lụrụ agha a tọrọ n'agha a.

Ndị agha Naịjirịa ole nwụrụ n'agha a?

Ili ndị agha a

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ala dị iche iche lụrụ ebe ha na-echeta ndị nwụrụ n'agha a

Otu ode akwụkwọ gbasara ihe mere mgbe gboo aha ya bụ Vadim Erlikman dere n'ime akwụkwọ ya "Handbook of human losses in the 20th century" na ndị agha Naịjịrịa ruru puku 85 tọrọ n'agha a.

Ndị agha Naịjirịa so ndị mba Briten bata yabụ agha.

Ọ gụbeghị

Ndị mba UK kwuru na ndị ụmụafọ ha ruru puku 886, 342 nwụrụ na yabụ agha.

Ha kwukwara na mmadụ nkịtị n'ala ha ruru 109,000 nwụrụ na yabụ agha.

Ndị ji akụkọ agha a n'aka na-ekwusike na mmadụ karịrị nde 40 bu ndị nwụru n'agha a.

Ọpkụkpụ ndi agha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ebe a ka Frans na-echeta ndị nke ha

Nyocha mere ka onyeọbụla na-ekwu na agha a bụ nke kachasị tọrọ isi mmadụ ka mgbe akụkọ ụwa bidoro.

Ruo ugbua, ha ka na-achọ mmadụ ruru nde 6 makana ha maghị ma ha nwụrụ anwụ maọbụ ha dị ndụ.

N'ime nyocha a BBC mere, a chọpụtakwara na ọ bụ ọrịa gburu ọtụtụ mmadụ n'agha a.

Mba dị iche iche so na yabụ agha

Ndị agha WW1

Ebe foto si, Getty Images

Ọstralia, Briten, Frans, Jamani, Russia, Austria-Hungary, Turkey, United states na ọtụtụ ala ndị ọzọ so n'agha.

Gịnị kpatara agha a?

Mba Austria-Hungary busoro Serbia agha n'afọ 1914.

Ihe a mere ka Rọshịa bụ mba na-akwado Serbia banye yabụ agha.

Jamani banyere na yabu agha maka ha na Rọshịa anaghi ahụ anya anya.

Tupu otu ntabi anya, Frans, Belgiom, Briten, Japan na ọtụtụ mba ndị ọzọ nwụbanyere na yabu agha makana a chọrọ ịkwado ndị nke ha na yabụ agha.