Orji Kalu abaala mmiri ọkụ ọzọ maka Nnamdi Kanu

Ebe foto si, ORJI UZOR KALU
Otu ụlọikpe etiti n'Abuja emeela mkpebi ọhụrụ ka onye chiburu dịka gọvanọ Abia steeti bụ Orji Kalu za ajụjụ gbasara ebe Nnamdi Kanu nọrọ.
Ụlọikpe a kpebiri na Orji Kalu ga-abịa za ajụjụ n'ụbọchị iri na anọ n'ịme ọnwa Novemba.
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ụlọikpe kpọrọ Kalu.
O kwukwara na onweghị ihe ọzọ Orji Kalu ga-eme na bụghị ịwụchịrị n'ụlọikpe.
Oku a na-abia makana akụkọ wuru ewu n'ime ọnwa garaaga kwuru na Kalu gwara ndị ntaakụkọ na Nnamdi Kanu nọrọ London.
N'akụkọ nyiri ibe ya, gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu ekwuola na Eze Obodo Afaraukwu Ibeku bụ Eze Kanu ma bụrụkwa nna onyeisi ndị otu IPOB ga-alaghachite na be ya n'oge na-adịghị anya.

Ebe foto si, Nnamdi Kanu/ Facebook
Ahubeghị nna Nnamdi Kanu kamgbe ndị agha Naijirịa wakpochara obodo ahụ n'afọ garaaga.
Ikpeazu kwuru na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ na-agba mbọ ịhụ na nna Nnamdi Kanu laghachịtere azu n'udo.
Okwu a ka ọ sara ndị Obodo Afaraukwu Ibeku mgbe ha rịọrọ gọvanọ Ikpeazu ka ọ kpọlatara ha Eze ha.
N'ọnụ okwu Ikpeazu: "Anyị niile ga-agba mbọ hụ na Eze Kanu batara na bee ya tupu ngwụcha afọ ọhụrụ a"
Ikpeazu kwukwara na gọọmentị etiti emeghị ka gọmentị ya mara tupu ha ejiri ndị agha wakpo obodo Afaraukwu n'agha akpọrọ "Operation Python Dance".
O kwuru na: "Echetera m na anọghị m na Naịjirịa oge Operation Python Dance mere. Alaghachiri m ngwa ngwa nakwa kpọ ọgbakọ n'etiti ndị eze maka idozi okwu a."
Gọvanọ Ikpeazu kwukwara na ndị Afaraukwu bụ obodo ndị udo, na gọọmenti ya ga-agba mbọ ị hụ na o mere ọtụtụ iheọma n'obodo ahụ.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị









