Akụkọ kachasị tata: Usain Bolt na-egbuke ka ọkụ n'otu bọọlụ ya
Usain Bolt na-egbuke ka ọkụ n'otu ya

Ebe foto si, Getty Images
N'Egwuregwu, Usain Bolt enyeela ọkpụ abụọ n'ime asọmpi eyin na eyin otu ya bụ Central Coast Mariners na Macarthur South West gbara.
Usain Bolt bụ nwoke ama ama na-efe ọsọ dịka nwamba n'ọhịa turu ọtụtụ ugo n'egwuregwu ọsọike dị iche iche.
Atiku ahọpụtala onye ga-eso ya n'osọ ntuliaka 2019

Ebe foto si, Getty Images
Akukọ putara ugbua bụ na Onye chiburu dịka gọvanọ Anambra Steeti bụ Peter obi ga-eso ọkọlọtọ otu PDP bụ Atiku Abubakar na n'ọsọ ntuliaka 2019 dịka osote onyeisiala.
Orji Kalu nwere oku n'ụlọikpe etiti

Ebe foto si, Orji Kalu
Ụlọikpe etiti n'Abuja ekpebiela ka onye bubu gọvanọ Abia steeti bụ Orji Kalu za ajụjụ gbasara ebe Nnamdi Kanu nọ.
Ụlọikpe a kpebiri na Orji Kalu ga-abịa za ajụjụ n'ụbọchị iri na anọ n'ịme ọnwa Novemba makana o kwuru n'ime ọnwa garaaga na Nnamdi Kalu nọrọ London.
Akwa na-akpọtụ na mba Uganda

Ebe foto si, Reuters
N'Africa, nnukwu ide apiti egbuola mmadụ iri atọ na mba Uganda.
Mberede a mere maka nnukwu mmiri zoro n'obodo ahụ mee ka otu oshimmiri hufere n'obodo ahụ.
Gee nkeji BBC
Lee ihe nkiri anyị taa
Ndị agha Naịjirịa akụọla nwata akwụkwọ ihe

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjịrịa akụọla otu nwaakwụkwọ ihe tinka kụru pan na Command Day Secondary school dị n'Enugu.
Chioma:Gideon Oguguo bụ onye gbara afọ iri na ise eyizughị uwe akwụkwọ were bịa akwụkwọ ụbọchị Tuzde.
Onye etinyele aka n'ụdọ na idi na-otu Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Buhari adọọla aka na ntị nye onye ọbụla ji udo na ịdịnaotu Naịjirịa tie epele.
Buhari kwuru nke a mgbe ọ nabatara Eze Abdulfatah Emetumah III nke Umuofor Oguta Imo Steeti n'obi ya n'Abuja ụbọchị Tọzde.
Church arịọla Mgbaghara

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, nwokorobịa ụkọ chukwu metọrọ na mba Saụt Afrika kemgbe 1980 a nabatala arịrịọ arịọrọ ya.
Chioma:William Segodisho sị na obi ederela ya jụụ ugbua agbanyeghị na ọteela ya gbawara mbọ ịmata ka ụwa aga anụ onu ya.
Real Madrid sị na ha ga-akpụpụ akwụkwọ akụkọ ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, otu egwu bọlụ Real Madrid ekwuola na ha ga-akpụpụ akwụkwọ akụkọ ahụ ụlọikpe bụ nke kwụru na ọ bụ ha gwara Ronaldo ya ekwela Kathryn Mayorga gbaa ya na anwụ.
Mayorga na-ebo Ronaldo na ọ wakporo ya na hotel dị na Las Vegas n'afọ 2009 mgbe ọ ka na-agbara Real Madrid.
Gee Nkeji nke mgbede a:
Lee ihe nkiri nke taa













