Buhari in Japan: Ipob na-erugharị na Japan na-achọ Buhari

Ipob na-ekwu na Buhari agaghị ọgbakọ a na-eme na Japan

Ebe foto si, Bashir Ahmad/Andy Syl/Facebook/Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị otu "Indigenous People of Biafra" (Ipob) na-ekwu na soshal midia na ha ahụbeghi onyisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari n'ọgbakọ a na-eme na Japan.

Nke a na-abịa dịka mba Japan na-ahazị ọgbakọ a kpọrọ 'Japan Tokyo International Conference on African Development' (TICAD) nke ugboro asaa ya.

Ndị otu Ipob bi na Japan gara na gburugburu ebe a na-eme ọgbakọ a na-ekwu n'ihe onyonyo na ha ahụghị onyeisiala Buhari n'ọgbakọ ahụ.

Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

Mana onye enyemaka Buhari na mgbasa ozi bụ Bashir Ahmad gosiri foto na twitter ebe Buhari, Praịm Mịnịsta ndị Japan bụ Shinzo Abe nakwa ndị ọzọ nọ n'ime ọgbakọ ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'ụbọchị 27 Ọgọst, 2019, ụfọdụ ndị otu Ipob gakwara n'ụlọ ebe onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba Japan bi, ma mee ngagharịiwe.

Ha kwuru na ha chọrọ imebọ onyeisiala Buhari ma gosi ndị ụwa na ọ bụ Jubril Al Sudan na-achị Naịjirịa.

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Cheta na onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu nyere ha iwu ka ha gbaa mbọ hụ na e mebọrọ onyeisiala Buhari na mba Japan ma ọ bịa ọgbakọ ahụ.

Buharị ga-ahapụ Japan lọtawa Naịjirịa n'ụbọchị Satọdee.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Lee foto etu TICAD7 si aga:

Buhari n'ime ọgbakọ TICAD7

Ebe foto si, TICAD7/flickr

Nkọwa foto, Buhari n'ime ọgbakọ TICAD7
Buhari n'ime ọgbakọ TICAD7

Ebe foto si, TICAD7/flickr

Buhari n'ime ọgbakọ TICAD7

Ebe foto si, TICAD7/flickr

Akụkọ ndị ga-amasị gị: