Abule Egba Clash: Ihe butere ọgbaaghara na mpaghara Abule Egba na Lagos - Ndị uweojii

Ọtụtụ mmadụ emerụọla ahụ ebe ngwa ahịa ndị mmadụ lakwara n'iyi n'ọgụ dapụtara n'etiti ndị otu nzuzo na ndị na-atụtụ akpakara na mpaghara Abule Egba, na Legọs.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Bala Elkana gwara BBC Igbo na ọgụ ahụ abụghị ọgụ agbụrụ dịka ndị mmadụ siri kwu.
Ọ kọwara na "ndị otu nzuzu a na-akpọ 'Awaawa" na ndị awụsa na-atụtụ akpakara nwere obere okwu nke mere ka ọgụ bido.
"Mana ndị otu anyị mere ngwa ngwa wuchie ebe ahụ.
"Ọ fọdụrụ obere ihe ka ọgụ ahụ ghọọ ọgụ ndị agbụrụ, mana ndị otu anyi ekweghi ka nke ahụ mee".
Elkana gakwara n'ihu kwuo na ndị uweojii ka nọkwa na okirikiri ebe ahụ maka adịghị ama ama.
Onye nọ nso ebe ahụ ziteere BBC Igbo foto nke gosiri ebe ngwa ahị ndị mmadụ lara n'iyi.
Ihe nrị ndị mmadụ na-ere n'okirikiri ahụ nke gunyere tomato, ose, ọka na ihe ndị ọzọ mebichara na ọgụ ahụ.
Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:











