Ike Ekweremadu: Ihe mere Ekweremadu bụ ịdọ ndị osuimi aka na ntị - Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nnmadi Kanu na-akatọ gọọmenti etiti maka mmegbu okwuru na ana-emegbu ndị Igbo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye ndu otu chọrọ mwereonwe bụ Indigenous People of Biafra (IPOB) ekwuola na ihe ndị otu ya mere Sịnetọ Ike Ekweremadu bụ ịdọ ndị osuimi aka na ntị.

N'ozi sị n'aka twitter pụta, Kanu gwara ndị ndu dịka onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Nnia Nwodo na ndị gọvanọ Igbo ka ha kpachara anya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ndị ndu ala Igbo kpachara anya

Ndị gọvanọ Ọwụwanyanwụ

Ebe foto si, South East Governors Forum/Facebook

Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo akatọọla mwakpo a sị na otu Ipob wakporo onye bụbu osote onyeisi Sịnetị Ike Ekweremadu na Nuremberg, mba Germany.

Onyeisi ha bụ Okechukwu Isiguzoro sị na ọ bụ nkata Ipob na-akpa iji mechuo ndị ndu Igbo ihu n'ihi iwe ma rịọ ka ndị ndu ndị ọzọ kpachara anya ha.

O kwuru na mwakpo gosiri na ndị ndu n'ala Igbo enwezighi nchekwa na o kwenyere na ọtụtụ n'ime ha nwereike izute ụdị ihe a mere Ekweremadu.

Isiguzoro sị n'akụkọ ọ na-anụ na mgbanwe amalitela n'ala Igbo na nke Ekweremadu a bụ iji mara etu ndị ọzọ ga-adị.

Ọwụwa anyanwaụ

Ebe foto si, Presidency/Twitter

Nkọwa foto, Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa

Ọ gara n'ihu katọọ akwa sị na ọ bụ njirimara nakwa omenala ndị Igbo.

Ọ rịọrọ arịrịọ ka akwụsị ụdị agwa na sị ka ndị ndu ala Igbo gbaa mbọ mee ka udi dị n'etiti ha na ndị ha na-achị.

Gọọmentị Akatọọla mwakpo Ekweremadu

Abike Dabiri

Ebe foto si, ABIKE DABIRI/TWITTER

N'otu aka ahụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi na mba ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa akatọọla otu mwakpo a e mere Sịnatọ Ike Ekweremadu

Dabiri-Erewa kpọrọ oku ka mba Germany gbaa mbọ hụ na ọ tara ndị a nke eji ụfọdụ n'ime eji ugbụa ahụhụ ruru ha.

N'ofesi

Ogbunigwe gbara n'Afghan

Ebe foto si, EPA

Ogbunigwe agbagbuola mmadụ iri isii na atọ ma merụọ mmadụ otu narị na iri asatọ ahụ n'ụlọ agbamakwụkwọ na Kabul, Afganistan.

Ihe mere n'ogige ebe ndị Shịa Muslim karịrị akarị mana onwebeghi otu sị na aka dị n'ịkpa arụ a.

N'ama egwuregwu

Pep Guardiola

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pep Guardiola bụ onye nchịkọta otu Manchester City

Onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Manchester City bụ Pep Guardiola ekwuola na ọ nabatala mkpebi ihe onyonyo VAR n'ịkagbu goolu ha nyere Tottemham

Goolu a akagburu si n'aka Gabriel Jesus dịka ọ fọdụrụ tịnkọm tịnkọm oge ka e gbuchie asọmpi ahụ.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile