Lizzy Anjorin vs Toyin Abraham: 'Agaghị m etinye ọnụ n'okwu mmadụ abụọ a'

Ebe foto si, Toyin/Lizzy/Nkechi Instagram Page
Esemokwu dị n'etiti Toyin Abraham na Lizzy Anjorin bụ chi na-efo ọ na-abawanye.
Nke mere ọhụrụ bụ akụkọ na-ewu na otu nwada Igbo ebola ya bụ nsogbu n'isi nwaada Igbo ọzọ na-eme ihe nkiri aha ya bụ Nkechi Sunday Blessing.
Mana mgbe BBC Igbo kpọrọ Nkechi Blessing, ọ gwara anyị hoo haa na onweghị ihe gbasara ya n'esemokwu ahụ.
O kwuru na ọ bụ eziokwu na ya na Toyin Abraham bụ ezigbo ọyị mana Toyin dọrọ onye ọbụla nọ n'akụkụ ya aka na nti ka ha hara itinye ọnụ n'okwu dịrị ya na Lizzy Anjorin.
Blessing kwuru na ọ bụ makana ọ gbara nkịtị kamgbe esemokwu a bidoro kpatara ndị mmadụ ji na-ebo ya na o butere ya bụ okwu.
Etu esemokwu Lizzy Anjorin na Toyin Abraham si malite
- Anjorin boro Toyin ebubo na o ji webụsaiti ya wee na-akatọ ya.
- Nke a mere ka Anjorin bido kọsasiwa na Toyin na-ebi ndụ iru abụọ ma na-ekwu na ọ bụghị n'obodo oyibo ka ọ mụrụ nwa dịka o si gwa ụwa.
- Toyin wepụtara onyonyo gosiri ebe ọ mụrụ nwa n'ibeju Lekki wee saa ebubo a.
- Toyin gakwara n'ihu kwuo na ọ ga-akpụkpụ Lizzy ụlọikpe.
- Lizzy boro Toyin ebubo ibu ọgwụ ike
Ndị tinyegoro ọnụ n'okwu a
Otu dịka "Theatre Arts and Motion Pictures Association of Nigeria"(TAMPAN) gosiri iwe ha gbasara esemokwu mmadụ abụọ a na-ese.
Ndị na-eme ihe nkiri na Yoruba a ma ama dịka Yinka Quadri , Bolaji Amusan nakwa di Toyin bụ Kola Ajeyemi arịọla ha ka ha tinye mma ha n'ọbọ.
Esemokwu dị n'etiti ndị ihe nkiri abụghị ihe ọhụrụ , ọ na-emekarị n'etiti ụmụnwaanyị na-eme ihe nkiri.









