Hauwa Leman: Otu BBOG na-eme ngagharị iwe n'Abuja ugbua

Nwata akwụkwọ Leah Sheribu

Ndị otu Bring Back Our Girls (BBOG) a malitele ngagharịiwe na Unity Fountain dị n'Abuja maka ogbugbu ndị Boko Haram gburu Hauwa Leman bụ onye ọrụ nlekọta ahụ so ndị otu Red Cross arụ ọrụ na Borno steetị.

Boko Haram tọọrọ ndị ọrụ Hauwa Leman na ndị Red Cross ọzọ afa ha bụ Alice Loksha na Saifura Hussaini Ahmed Khorsa n'ọnwa maachị 2018 mgbe ha mere ebe ha nọ ọrụ na ebe ndị gbara ọsọ ndu nọ.

N'ime ọnwa Seputemba, Boko Haram gburu Saifura Ahmed Khorsa ma nye gọọmentị Naịjirịa iwu ka ha tọhapụ ndị Boko Haram eji eji maọbụ ha egbuo ndị ọzọ.

Mana gọọmentị Naịjirịa emeghi ihe a Boko Haram kwuru rue ụnyaahụ. Ndi omekome a gburu Hausa Leman ma kwuo na ha ga-eme Leah Sheribu na ndị ọzọ ga-abụ ohu n'aka ha.

Ndị atọọrọ na ndị ha Boko Haram gburula

Nke a mere oke iwe jiri ju ndị Naịjirịa obi nke butere ngagharịiwe otu BBOG na-eme ugbua.

Onyeisi ha bụ Oby Ezekwesili so na ndị na-eme ngagharịiwe a mana o zoro onwe ka ndị ntaakụkọ ha iseta ya foto ma ọ bụ ị jụ ya ajụjụ ọnụ.

BBOG

Ndị ọzọ na-eme ngagharịiwe a gwara BBC na iwe ha bụ na o nweghi ihe gọọmentị etiti na-eme iji kwụsị ogbugbu ndị atọọrọ.

Ndị ọrụ nchekwa nọ n'ebe ahụ ị chịkọta ndị na-eme ngagharịiwe.

Cheta na ndi Boko Haram ka jikwa Leah Sheribu bụ nwata akwụkwọ Dapchi.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: