Sowore enwerela onwe ya n'aka ndị DSS

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

N'ikpeazu, Sowore enwerela onwe ya n'aka ndị DSS

Femi Falana, Omoyele Sowore na Olawale Bakare (n'isi isi aka nri)

Ebe foto si, Twitter/Sahara Reporters

Nkọwa foto, Ọbụ na mgbede Tọzde ka Sowore na Bakare nweere onwe ha.

Omoyele Sowore enwerela onwe ya.

Sowore, onye nwe ụlọọrụ ntaakụkọ Sahara Reporters anọọla n'aka ndị uweojii nzuzo bụ DSS ihe karịrị ọnwa anọ.

A tọhapụrụ ya na Olawale Bakare na mgbede Tọzde.

Nke a mere dịka Ụlọikpe dị n'Abuja nyere iwu n'ehihie Tọzde ka ndị DSS were ọso were ije tọhapụ ya.

Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu bụ onye nọ n'isi ikpe ahụ baara ndị DSS mba maka ijide Sowore na Bakare bụ ndị o nyere iwu ka atọhapụ.

Ojukwu riri ndị SSS iwu otu narị puku Naịra (N100,000) maka nnupuisi ha.

Ọbụ n'ọnwa Ọgọst a ka ndị DSS nwuchiri Sowore na Bakare n'ihi ngagharịiwe 'Revolution Now' ha na-ahazi.

Igando Fire: Ọkụ ataala isi mmadụ abụọ gara ka ụkọchukwu saa ha ahụ na mmiri

Ọkụ Igando
Nkọwa foto, Ọkụ na-agba n'okpuru ogwe mmiri ahụ

Ọkụ si na okporo mmanụ agbịdị agbagbuola mmadụ abụọ soro ụkọchukwu ụka ekpere gaa isa ahụ na mmiri n'Igando dị na Legọs 'ụtụtụ Tọọzde.

Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC na otu ụkọchukwu ụka ekpere a kpọghị aha ya duru mmadụ abụọ ị ga saa ha ahụ n'iji mezuo ekpere ọ na-ekpere ha oge ya bụ ọdachị dapụtara.

"Ndị nọ nso n'isi ụtụtụ ahụ gwara ụkọchukwu ahụ ka ha ghara ị ga na mmiri ahụ n'ihi na ndị ohi mmanụ kpara mkpamkpa n'abalị."

"Mana ọ kwuru na nke a bụ nke atọ o kwesịrị ha eme ya iji gbochie ọdachi ịbịagide ndị bịara ịnara ekpere."

"Ngwangwa otu n'ime ha kpara ọkụ, ebe nillie nwuru ọkụ."

Mmadụ abụọ ndị ahụ nwụnyụụ anya, ebe ụkọchukwu zọtara ndụ ya ma nọọ n'ụlọgwụ akpọghị aha ya enweta nleta maka nnukwu ọkụ gbara ya.

Akụkọ na-akọwa na ọ bụ ndị mmadụ kupuru okporo mmanụ ahụ, mere ka mmanụ na-awụba na mmiri nọ nso ebe ahụ.

Akụkọ anyị nụrụ sị na ọ bụ otu ụkọchukwu na ndị otu ya gara ekpere isi ụtụtụ na mmiri dị n'akụkụ ebe ahụ, ji uriọkụ Bekee gafee ebe ahụ mere ka ọ bara ọkụ.

Ndị ọrụ Lasema

Ebe foto si, LASEMA

Ndị bi n'ogbe ahụ sị na ndị ọkụ gbatagbata abịghị n'oge imenyụ ya bụ ọkụ, bụ nke mere ha jiri were aka ha menyụwa ya bụ ọkụ.

Mana ka ọ dị ugbua, ndị ụlọorụ gbatagbata Lasema ebuputala ozu ahụ ma na-achọ ma e nwere ndị ọzọ ọkụ a metụtara.

Ọkụ gbara n'Igando

Ya bụ ọkụ ka na-agba n'ime ime ya bụ mmiri ebe ukwu agaghị agali.

Ndị uweojii
Nkọwa foto, Ndị uweojii na onwe ha erutela ebe ahụ inyere aka
Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ụlọomeiwu ukwu akwadola bọjet 2020

Senate

Ebe foto si, Twitter/NGRSenate

Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari bugaara ha bọjet ahụ n'ọnwa Ọktoba.

Ihe Buhari depụtara gọọmentị ya ga-emefu bụ tarị Naịra iri na ụma atọ (N10.330,416,607).

Mana ihe ndị omeiwu ukwu kwadoro bụ tarị naịra iri na ụma ise (N10.594,362,364).

Ha kọwara na ọbụ ka ego wee zuo maka ọrụ dị mkpa gọọmentị ji n'aka,

Gịnị ka nwaanyị a ji isi kote?

Otu nwaanyị dị afọ iri abụọ na atọ na-azọ ndụ ya n'ụlọọgwụ ka a mụnyere ya ọkụ maka ịgba mmadụ akwụkwọ n'obodo Uttar Pradesh dị na mba India.

E sunyere ya ọkụ ahụ oge ha jidere ya n'ụzọ ebe ọ na-aga n'ụlọikpe ịnụta ikpe gbasara ụmụnwoke abụọ o boro ebubo idina ya n'ike.

A ga-achụ onye nchịkọta Everton?

Marco Silva onye nchịkọta Everton

Ebe foto si, Reuters

Kepu kepu si ọgbọ egwuregwu bọọlụ na-akọwa na e nwere ike ịchụpụ Marco Silva n'oche nchịkọta Everton.

Ọ bụrụ na nke a mee, Silva ga-abụ onye nchịkọta nke anọ a na-achụ n'ime izu atọ a.

Ndị Gọvanọ sị ka Buhari gbatara Allen Onyema ọsọ enyemaka

Allen Onyema

Ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ etinyela ọnụ n'okwu gbasara ebubo mmerụaka mba Amerịka na-ebo Allen Onyema bụ onye nwe ụgbọelu Air Peace.

Ha kwuru na gọọmentị Naịjirịa anaghị agba ya mgba okpuru, ma kpọkuo Onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa onye nnọchiteanya mba Amerịka na Naịjirịa ka o nyere ya aka.

Ha sị na ọnweghị ihe dị iche na ya bụ ihe mere Onyema maka na ụlọọrụ ọbụla na-eto eto na-enwe ọgbatauhie tupu o tozuo.

Ndị Gọvanọ ahụ sị na ọnweghị ihe na-esere Onyema na gọmenti etiti na ha nụla ka ọ kelere ha maka inyere ya aka ịnwete asambodo ikike ruru ise maka ọrụ ya.

Ha kwukwara na ọtụtụ na gọmenti Buharị akwadola Onyema n'ọrụ ya.

Aha onyonyo, Ihe mere m ji kpọlata ndị Naịjirịa nọ Saụt Afrịka

Ndị Gọvanọ a rịọrọ onyeisiala Muhammadụ Buhari ka o biko jisike na-akwado Allen Onyema dịka o si eme.

Mba Amerika boro Onyema ebubo i si azụụlọ bupu ego dị nde dollar iri abụọ ofesi maka ịgote ụgbọelu.

Ụlọọrụ United State Department of Justice kpụpụrụ Onyema ụlọikpe ka ọ bịa zara ọnụ ya maka nke a.

Onweghi ndị otu anyị a na-achọ achọ - Red Cross

Red Cross

Ebe foto si, Getty Images

Ndị otu Red Cross ekwuola na onweghị onye otu ha ọbụla a na-achọ achọ.

Nke a na-abịa dịka ndị oyindụegwu bụ Islamic State kwuru na ha atọrọla ndị otu Red Cross abụọ.

Ha kwukwara na ha tọọrọ ndị ụka Kraịst asatọ na ndị agha isii na mpaghara Borno steeti dị na Naịjirịa.

Atọrọkwala ndị India

Akụkọ si India na-apụta na-akọwa na a tọrọla ndị mba ha ruru mmadụ iri na asatọ na otu onye si mba Tọki, nso okeosimiri na Bonny dị na Naịjirịa n'ụbọchị Wenesde.

N'egwuregwu,

Chelsea ekweghi anụ 'kam' ka ha ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Aston Villa na be ha na Stamford Bridge.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ebe Ole Gunnar Solskjaer na-achịkọta Manchester United ekweghi ka ọgọdọ Jose Mourinho yọchie ya anya, ka ha jikwa goolu abụọ a satara otu merie.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Onye kwesiri isi nri n'ụlọ: Di ka ọ bụ nwunye?

Akụkọ ga-amasị gị