Allen Onyema sị na onweghi nrụrụaka ọbụla o mere n'Amerịka maọbụ ebe ọbụla

Allen Onyema
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisi ụlọọrụ Air Peace bụ Allen Onyema agọọlas ụkwụ na aka maka ebubo nrụrụaka mba Amerịka na-ebo ya.

N'ozi Air Peace tinyere n'akara Twitter ha, ha sị na ọ bu ego Maazị Onyema ka o jiri gote ụgbọelu na-akụrụmgwa ya.

"Onweghi ego ọbụla o butere n'aka ụlọakụ maọbụ mmadụ. Nke mere na onweghi ụlọakụ na mba ofesi na chọ ego ha maka nke a."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nke so akụkọ pụtara n'ọba internet ụlọọrụ gbasara ikpe nke mba Amerịka n'obodo Atlanta, na-akọwa na ha na-ebo Allen Onyema bụ onyeisi Air Peace ebubo maka nrụrụaka.

Na nkọwa ha, Maazi Onyema na onye na-ahụ maka ego na nhazi n'ụlọọrụ Air Peace bụ Ejiroghene Eghagha, nwere azịza maka nrụrụaka.

Ebe ebubo ha wụkwasara Onyema metụtara ihe Bekee kpọrọ "Money Laundering", nke Maazị Eghagha metutara igwu ulọakụ chandum na izu aha mmadụ.

Dịka ozi si ngalaba na-ahụ maka ikpe nke obodo Atlanta siri kwuo, Ọkaiwu Amerịka aha ya bụ Byung J Pak, sị na Onyema ji aha na ọ bụ ojiegoachụego ama ama mee nrụrụaka.

Pak sị; "Anyị ga-agba mbọ hụ na anyị gbochiri ohere ndị mmadị ga-eji chọọ ịghọrị ụlọakụ anyị, ọ sọkwa ya bụrụ na ndị chọrọ ime ihe yi uwe ka ndị ojiegoachụego nke mbaụwa."

Allen Onyema, Saleh Alhassan, Sammuel Ortom

Ebe foto si, @benuestategovt

Nkọwa foto, Mgbe Onyema kpere udo n'etiti ndí Fulani na-achi ehi na ndí Benue steeti

Onye ọzọ okwu ya pụtara n'ọba ịntanetị ahụ bụ Thomas J. Holloman, bụ onye na-enyocha mpụ banyere ụtụisi n'Amerịka, sị, "Dịka etu ụlọakụ anyị siri dị mkpa maka mbughari ego na mbaụwa niile, ndị na-achọ iji aghụghọ mee nrụrụaka site na inye akwụkwọ adịgboroja, kwesịrị ịma na anyị ga-anwụchị ha makana ndị ọrụ anyị na-arụkọ ọrụ."

Otu ebubo ha boro Onyema bụ na o nwere ọtụtụ akụnaụba dị ka ha eziri ezi na Mba Amerịka mana ha bụ ụzo o si eme ihe a ha kpọrọ nrụrụaka.

Akwukwọ a metụtakwara ọnụ na ngalaba dị iche iche Allen Onyema hibere iji hazie udo na Naịjirịa dịka "Foundation for Ethnic Harmony, International Center for Non-Violence na Peace Development, na All-Time Peace Media Communications Limited."

Aha onyonyo, Ihe mere m ji kpọlata ndị Naịjirịa nọ Saụt Afrịka

Cheta na Onyema natara ezigbote ekele n'aka ụmụ Naịjirịa maka etu o si gbatara ndị ọgbaghara ịkpa oke agbụrụ mere na mba Saụt Afrịka n'afọ 2019 a metụtara, site n'ịwepụta ụgbọelu ga-ebulata ha.

Onyema bụkwa onye na-agba mbọ maka udo Naịjirịa site n'ịkpọkọta ndị nwere ọgbaghara.

Aha onyonyo, Ihe asatọ Allen Onyema sị na Igbo ga-ejide n’aka iji gaa n’ihu