Lagos ọ bụ obodo pụrụ iche n'Africa?

Ebe foto si, Getty Images
Nnọọ na Legọs; obodo na-anaghị arahụ ụra, ebe nchekwube na ndị nwere nchekwu juru, ebe ihe ọbụla na ihe niile nwereike ime - ma ọ bụrụ na oke ịkwụ n'ahịrị ha anọchighi gị ụzọ.
Ịza aha otutu na-adị ndị Naịjirịa oke mkpa na Naịjiria, ọ bụkwa ihe e ji egosiputa ọkwa mmadụ ọkachasị ebe ndị nọ n'ọchịchị nọ, dịka Nduka Orjinmo nke BBC nọ na Legọs si kwuo.
Legọs bụ steeti kachasị pee mpe na Naịjirịa ma a bịa n'ebe ala ha, mana ebe ọ na-eburughi ka o ji agwa mezuo.
Site n'oge i si n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammad pụta, ị ga-ahụ ihe mere o ji bụrụ oke obodo mepere emepe, siri ike dị egwu.
'Omenaala itinye uchu n'ọrụ'
N'agbanyeghi na Abuja nọchiri ya dịka isiobodo Naịjirịa n'afọ 1991, ọ bụ obodo obi nwereike ịka gị ịsị na ọ bụ ya kacha mkpa, obodo a na-agba mbọ nakwa mpaghara dị ezigbo mkpa.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Naịjirịa si na gburugburu mba a, n'agbụrụ dị iche iche, na-agba mbọ dị iche iche, na-awụbata 'ọgbọ nke mgbata mbọ' ebe ha na-achọ ma ọ ga-adabara ha.
Obodo a bụ ebe obibi nye ọtụtụ ụlọọrụ sitere na ndị nke agba ochie dịka ụlọọrụ mmepụta na ụlọakụ, ruo ndị nke agba ọhụrụ dịka teknụzụ na iji teknụzụ agbasa ozi na mkparịtaụka, ọ bụkwa ebe ọdọụgbọmmiri abụọ kachasị mkpa na mba a dị nakwa ebe ọtụtụ ahịa na-ewu ewu a na-ere ihe niile gụnyere ma akwụkwọ, nka makwa eletrọniks dịkwa.

Ebe foto si, Getty Images
"Anyị nwere nnukwu omenaala itinye uchu n'ọrụ rara ahụ ịchọta ebe ọzọ," ka Funmi Oyatogun, onye hibere TVP Adventures, ụlọorụ na-ahụ maka njem nlegharịanya kwuru.
"Na Legọs, onye ọbụla na-achọ ịrụ ihe ọzọ a ga-akpụ n'ọnụ, igbo mkpa nke ọzọ na-ewelite isi, ịrụpụta ihe onye ọbụla na-achọ maọbụ ihe ga-egbo mkpa ndị mmadụ, ya na-eme ka ike ghara ị na-agwụ obodo a ma mekwaa ka ọ bụrụ mepere emepe".
'Mmụọ ịgba mbọ'
Na Legọs, oke mkpọtụ na-adịkarị; nke si n'opi ụgbọala, nke si n'igwe na-enye ọkụ latrik nakwa nke ndị mmadụ ruru nde kwuru nde na-agagharị mkpa ha na-eme; ọsọ ya bụrụ ụkwụ ka ha ji aga, ọgbatumtum, ụgbọala (ọkachasị danfo na-acha edo edo bụ nke e ji mara obodo a), maọbụ ụgbọala BRT bụ ndị ọgbara ọhụrụ, ndị Legọs ruru mmadụ nde 21 anaghị anọ otu ebe.

Ebe foto si, Getty Images
A na-atụ anya na mmadụ ka ga na-amụbanye ma ruo nde 88 n'afọ 2100, nke ga-eme ka mmadụ karịa n'obodo na-enwechaghị ihe owuwu na-ezuru ya ugbua.
Mana ndị Legọs bụ anwụ anwụ.
"Ndị bi na Legọs dị iche," ka Chimamaka Obuekwe bụ onye hibere ụlọọrụ njem nlegharịanya The Social Prefect Tours kwuru.
"E nwere ụdịrị mmụọ ịgba mbọ obodo a nwere. Ike anaghị agwụ ya agwụ, egwuregwu na-amasị ya, ọ na-anabata mmadụ."

Ebe foto si, Getty Images
N'ihi nke a, ọ bụghị ebe ga-ejiri nwayọ dọbata gị n'ime mmemme ya na-anaghị akwụsị akwụsị; ọ naghị emere mmadụ ebere, ọ naghị agbaghara, ọ naghị aga nwayọ nwayọ.
Ụzọ ị ga-esi na-aga nke ọma n'ime ya bụ site n'inwe ụzọ ị ga-esi nọkwata, gbado anya nakwa dị njikere maka ihe ọbụla Legọs ga-eweta.
'Isiobodo Omenala'
Mana o nwere ihe ọzọ eji mara Legọs karịa azụmahịa, o teela aka a na-ahụ ya dịka isi oboso omenala mba Naịjirịa.
Njirimara a jisike na-ebiri ọkụ dịka ejije, egwu nakwa ejiji mba ahụ na-abawanye.

Nollywood, ụlọọrụ ejije nke bụ atọ na mbaụwa niile bụ ebe ka isisụlọọrụ ya dị.
Ọ bụ n'ọnwa atọ na ngwụcha afọ ọbụla ka emume n'uju n'ihe metụtara nka, odideakwụkwọ, ejije, egwu nke so egosi ụtọ ndị mmadụ nwere ebe ihe ndị Naịjirịa dị.

Ebe foto si, Getty Images
"Ọ bụ obodo kachasị na-akpọtụ akpọtụ m hụrụla n'Afrịka niile" ka Oyatogun kwukwara.
"Ọ bụ omume nwere ume kachasị, mmekọ anyị, mmemme anyị nakwa etu anyị si emume bụ ọpụrụiche n'ebe mpaghra ndị ọzọ dị".
"Ike ndụ agaghị agwụ gị na Legọs"
Mmemme bụ ihe ọzọ eji mara Legọs n'ihi na ndụ abalị ya bụ nke ude ya na-ede.
Mgbe ọbụla ịchọrọ o nweriri ebe mmemme na-aga n'ihu site n'ụlọ mmanya dị icheiche, ụlọ oriri na nkwarị na ebe ndị ọzọ na-akpọ egwu Burna Boy, Wizkid nakwa dike Afrobeats a ma ama bụ Fela.
Legos nwere ya.

Ebe foto si, Getty Images
"Ị nwereike ị ga ụlọ mmanya nakwa ụlọ egwu dị ọtụtụ na Legọs ma ghara izu ike kama otu nkeji," ka Obuekwe kwetara.
"Ọ bụ ogige egwu na mmemme, abịa na ihe ịnweta onwe gị, ike ndụ agaghị agwụ gị na Legọs"

Ebe foto si, Getty Images
Mana ọ bụrụ na ịbụghị onye mmemme na-amasị, ị na-achọ ihe enweghi oke mkpọtụ, Legọs nwekwara ya.
N'agbanyeghị na eji ndụ ọsọ ọsọ mara Legọs, e nwere ikpere mmiri, ọhịa ezumike nakwa ebe a na-echekwa anụmanụ ebe e nwere okporoụzọ imeọhịa kachasị to ogologo n'Afrịka.

Ebe foto si, Getty Images
"E nwere otu akwụkwọ, otu ịgba ọsọ, otu Yoga, otu ezumike ụbụrụ ebe ndị mmadụ nwereike ị ga gosipụta onwe ha, anyị nyere mmadụ aka bido ọgbakọ ndị na-agba ọtọ" ka Emeka Okocha bụ onyeisi ogige mmeme akpọrọ 'Nothingto Do in Lagos'.
Ọ bụrụ na ọ gụrụ gị agụ ịme nyocha na obodo a, ị ga-achọta ihe ga-amasị gị"









