Ihe ịhụnanya Jazz na-ebute

Olakunle Tejuoso na Jazzhole Lagos

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Olakunle Tejuoso n'ọdọahịa egwu ya na Lagos

Olakunle Tejuosho kwụ n'ime ụlọahịa egwu ya, The Jazzhole yiri uwe 'buba' na 'sokoto' na-agwa ndị ọrụ ya okwu.

Ọ malitere ịcheta maka egwuregwu kachasị masị ya mgbe ọ dị n'ụmụaka.

"Na mbụ, e nwere m olileanya na m ga-enwe ọdọahịa egwu...e bidoro m ịdokọ egwu mgbe m bụ nwata.

"Ọ dịrị m mfe ịsoro ụzọ egwuregwu nwata m mgbe m gụchara akwụkwọ" ka Tejuoso kwuru.

The Jazzhole

Ebe foto si, Princess I. Abumere/BBC

Nkọwa foto, The Jazzhole

The Jazzhole nke dị n'ụzọ Awolowo na Legọs bụ uzo mepee n'afọ 1991 n'ebe ọzọ n'obodo ahụ.

Ugbua, mgbe ụdịrị egwu "Afrobeat" na-ewu n'igwe okwu nakwa ebe niile, The Jazzhole na-echekwa ụdịrị egwu ọzọ pụrụiche.

Ya mere na ọdọahịa egwu ahụ bụ otu ebe ndị mmadụ na-aga ịcheta nakwa ịgere egwu ochie a ma ama na mbụ.

N'ime The Jazzhole

Ebe foto si, Princess I. Abumere/BBC

Nkọwa foto, The Jazzhole nwere egwu Jazz si n'oge gboo dị icheiche

"Na mbụ anyị mepere, ebumnuche anyị bụ ịre egwu Jazz na egwu Afrịka ọbụla, ya bụ egwu ndị ojii"

Mgbe ahụ egwu ndị a na-ewu ewu n'afọ ndị 1990, mana ugbua, ụdịrị egwu ndị ọzọ amalitela.

"[Ndị na-azụ m ahịa] bụ ndị ọgaranya, mgbe teknụzụ CD ka dị ọhụrụ. Ọbụghị sọsọ ịzụ, ha ghọtara egwu ahụ n'ihi na ha ahụla ụfọdụ otiegwu ahụ.

"Ha agaala mba ofesi ma nwekwaa ego iji gaa n'ogige egwu ndị a"

Kasetị egwu Jazz dị icheiche

Ebe foto si, Princess I. Abumere

Nkọwa foto, Kasetị egwu Jazz dị icheiche

Tejuoso kọwara na n'oge a, ndị mmadụ chọrọ "jazz funk" nakwa "smooth jazz"

"Ndị ntorobia oge a dị iche karịa mgbe anyị na-eto eto"

N'agbanyeghị na anyị na-egere egwu mgbe anyị chọrọ, The Jazzhole ka na-ere kasetị egwu.

Ebe foto si, Princess I. Abumere/BBC

Nkọwa foto, N'agbanyeghị na anyị na-egere egwu mgbe anyị chọrọ, The Jazzhole ka na-ere kasetị egwu.

Egwu a na-agụ ugbua

The Jazzhole bụkwa ebe a na-agụ egwu ugbua ugbua. Tejuoso sị na ọ bụ iji wụlite ọnụọgụgụ egwu erere ere ka o ji bido nke a.

"Ị ga-echeta na anyị malitere tupu teknụzụ ịntanetị amalite. Mgbe ahụ ịchọ ịre kasetị egwu ị ga-eji igwe okwu maọbụ ịchọọ ụzọ ọzọ ị ga-esi kpọbata ndị mmadụ n'ime ọdọahịa egwu gị. Ya mere na ị ga-enwe ogige egwu ma ree kasetị na ngwụcha ya iji gbasa ozi maka egwu ahụ."

Ọnọdụ otiegwu Nneka na The Jazzhole

Ebe foto si, Princess I. Abumere/BBC

Nkọwa foto, Ọnọdụ otiegwu Nneka na The Jazzhole n'Ọgọst 2019

The Jazzhole anabatala otiegwu dị icheiche dịka Asa, Brymo nakwa Nneka.

Dịka Tejuoso na-echeta ihe ndị mere n'afọ ndị 1990, ọ kpọ nwunye ya so nwere ọdọahịa egwu ahụ ịjụ ya nke ya.

"Maka mụ, ọ ka bụ mgbe [Fatai Rolling] na-ewu. Abịa n'egwu, ọ bụ ụbọchị ochie ndi ahụ" ka o kwuru.

Tejuoso na-echeta mgbe mgbe otu onye so tipute egwu "highlife" Fatai Rolling Dollar na otiegwu Keziah Jones na-agụkọ egwu.

"Sọsọ etu egwu onye si n'oge gboo ahụ [1950] na ndị otiegwu 1990 si ejekọ ọnụ.

Otiegwu Naịjirịa Fatai Rolling Dollar ebe ọ na-eti egwu na Cargo n'ụbọchị 14 n'ọnwa Juun, 2009 na London.

Ebe foto si, Jon Lusk/Getty

Nkọwa foto, Otiegwu Naịjirịa Fatai Rolling Dollar ebe ọ na-eti egwu na Cargo n'ụbọchị 14 n'ọnwa Juun, 2009 na London.

"Ọ tọrọ m ụtọ pụrụiche nakwa ndị na-egw egwu a, ihe mere ndị egwu ochie na ndị ntorobia ji bịakọta ọnụ."

"Nke Asa pụrụiche. Ọ pụrụiche n'ihi na ndị mmadụ juputere ebe niile" ka nwunye kwuru.

Egwu kasetị nke Jazzhole

Dịka ndị mmadụ jisike achọ egwu ndị Afrịka, Tejuoso ekpiebe na ọ gaghị sọsọ onye orure kama onye nrụpụta egwu. Ya mere na o bidoro ụlọ egwu nke ya n'afọ 1995.

"Na afọ ndị 1990s, ọtụtụ ihe anyị nwere bụ ịbubata egwu Afrịka si mba Yurop maọbụ ebe ọzọ n'Ofesi.

"Etetara m ụra otu ụbọchị kwuo na anyị kwesiri ị na-arụpụta egwu nke anyị. Etu ahụ ka anyị si bido ụlọegwu m"

Egwu ndị Jazzhole Records rụpụtara

Ebe foto si, Princess I. Abumere/BBC

Nkọwa foto, Egwu ndị Jazzhole Records rụpụtara

N'agbanyeghị na egwu Jazz agbanweela dị ka enwere egwu ndị ọzọ, Tejuoso kwenyere na ohere ka dịrị ya n'ahịa egwu Naịjirịa.

"Ọ bụrụ na jazz ga-enwe ọdịnịhu ebe a, anyị ga-eme ya asụsụ anyị. Anyị ga-atụgharị ya n'ime onwe anyị."

Ọtụtụ ndị a ma ama dịka Salif Keita, oti egwu mba Mali, Lupita Nyong'o, Danai Gurira nakwa Eze Mohammed VI nke Morocco.

N'ime Jazzhole akwụkwọ, kasetị na CD egwu Jazz nakwa usi kọfị gosiri na ọ bụ ebe ga na-amasị ndị hụrụ jazz n'anya

"Maka mụ, jazz dị mkpa ma ndị mmadụ bịa ị gere ya bụ egwu n'abụghị ịse sịga ma ṅụọ mmanya n'elu egwu ahụ. Ọ bụ ụzọ pụrụiche iji nabata egwu ahụ."