Ipob Anambra clash: Gọọmentị Anambra ekwubeghị pịm banyere ọgbaghara a

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara Ifite Ọraifite ebe ihe mere kọwara etu mmadụ jiri kọọ n'Ọraifite.
Ọ sị na ndị ọ hụrụ na-atụ ụjọ ịgwa anyị n'ihe onyoonyo ka ihu ha gosi, ebe niile dịka ha na-agba ọsọ agha.
Ahịa, okpororo ụzọ tọgbọrọ chakoo.
Ndị Ọraifite dọrọ onye ntakụkọ anyị aka na ntị ka o mee ọsịịsọ gbapụ ebe ahụ maka etu obodo dị.

Ebe foto si, Haruna Mohammed
Ndị uweojii nyere aha ndị otu ha nwụrụ dịka Maazị Joseph Akubo, onye ji ọkwa" Assistant superintendent" na Maazị Oliver Abbey, onye bụ onyeisi uweojii na-achịkọta Ọraifite.
Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo akatọọla njem ahụ ndị uweojii gara n'Orifite maka oku agbara ụlọ ndị mmadụ nakwa ndị egburu mgbe ha gara ijide ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor.
Ọ kpọrọ oku a n'Enugwu ụnyahụ ebe ọ sị ka ehibe ụlọikpe pụrụiche ga-elebe anya na ya bụ okwu bụ nke ọ sị na ọ nweghị ezigbo ihe mere ebe ahụ ndị uweojii ga-eji kpaa ụdị agwa ha kpara ebe ahụ.

Ndi otu Ipob na-ekwukwa na egburu ndị otu ha.
Nwodo sị na ọ dịghị mma ndị uweojii ịbute ọgbaghara n'obodo ebe ọ bụ na ọ bụ otu onye, Ifeanyi Ejiofor ka ha chọtara.

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor Facebook/BBC
Ndị otu Ipob agọọla aka ha na ụkwụ ha n'ebubo ndị uweojii Anambra steeti bọrọ ha na ha gburu ndị uweojii abụọ n'Ọrafite, Anambara steeti.
N'akwụkwọ ozi ha wepụtara, nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powereful binyere aka, Ipob kwuru na ọ bụghị ha gburu ndị uweojii a na-ebo ha n'ebubo.
Ha boro ebubo na ndị uweojii wakporo ụlọ ọkaiwu onye ndu ha bụ Ifeanyị Ejiofor abali anọ ọ kwachara nwanwe ya nwoke, gbaa ụlọ ya ọkụ iji maja ya n'ikpe Kanu ga-abịa n'ọwa ọzọ.
Ha sịrị: "Nke bụ bụ eziokwu bụ na ndị uweojii na ndị agha gara n'ụlọ ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor ..."
"Oge ha rutere, ha bido gbawa ndị mmadụ enweghị ngwaọgụ ọbụla ha ji egbe, ha gbagburu ụmụnwoke abụọ si n'ụlọ ya pụta, buru ozu ha tụnye n'ụgbọala ha mapụọ iji gbochie ihe aka ebe."
"Ha wụkwara mmanụ ụgbọala n'ụlọ Ejiofor ma sunye ya ọkụ."
Ihe ọkaiwu Ifeanyị Ejiofor kwuru maka ihe mere

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/Facebook
Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor ebe ọ na-ekwu na ndị uweojii emeela ya onye enweghị ebe obibi.
Onyeisi ndị uweojii na Anambra steeti bụ John Abang arịọla ọha ka ha chọta ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor na ndị otu ya.
Otu onye wenitere isi n'Oraifite na achọghị ka akpọpụta aha ya ekwuola na ndị otu Ifeanyi Ejiofor gụnyere ụfọdụ ndị otu Ipob nakwa otu nzuzo akpọro 'otu Eke' gburu ndị uweojii abụọ .
O kwuru na ọsọ ka na-agba n'Oraifite ruo ugbua maka ya bụ ọdachị.
O kwuru na ọdachị metụtara ahịa nkwọ zụrụ ụnyahụ makana onye ọbụla riri mbombo ọsọ ruo ugbua.
O kwuru na ọkaiwu Ejiofor na ndị otu ya agbafuchala.

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed sị na ndị ha na-eche na ha bụ ndị Ipob wakporo ma gbuo ndị otu ha abụọ gara ịkpụta Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor na be ya dị n'Oraifite di n'okpuru ọchịchị Ekwusigo n'Anambara steetị.
Dịka Maazi Haruna siri kwuo, ha gara be Ọkaiwu Ejiofor maka mkpesa n'aka dị na mmebi ihe na ntọrị mmadụ.
Ifeanyi Ejiofor bu ọkaiwu onyeisi otu akpọrọ na Bekee "Indigenous Peoples of Biafra" (Ipob) bụ Nnamdi Kanu.
Haruna sị "Ọ bụ onyeisi ndi uweojii n'Oraifite bụ Oliver Abbey du ndị uweojii ga na be Ifeanyi Ejiofor."
O kwukwara na "Ka he ruru ebe ahụ ndị echere na ha bụ ndị Ipob wakporo ha ma gbuo mmadụ abụọ n'ime ha, merụọ ụfọdụ ahụ. Ha gbakwara ụgbọala ndị uweojii ọkụ."
Ifeanyi Ejiofor mechara akwamozu nwannw ya nwoke n'ụbọchị Satọde na be ya.
Nnamdi Kanu n'owe ya si na ọ bụ ndị"Ezinaụlọ Ipob" ka egburu n'ụtụtụ Monde.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ụfọdụ ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi ụlọ ndị gbara ọkụ n'ime onyoyo na-ekwu na ọ bụ be na agbataobi Ejiofor ka ọkụ a na-ere.
BBC Igbo jụkwara Mohammed maka ya bụ ọkụ mana ọ sị na ya amaghị maka nke ahụ.
N'gbanyeghi nke a, ọ sị na ndi uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ agbachiela Oraifite iji jide ndị ọ si kpara mkpa mkpa a.

"Anyị anwụchiela ụfọdụ n'ime ndị mere ihe ka na-achọkwa ndi ọzọ."
BBC Igbo gbara mbọ inwete Ọkaiwu Ejiofor n'ekwentị ya mana ọ mịtaghị mkpụrụ.
BBC Igbo kpokwara ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful mana ọsaghị mgbe ekwentị ya kpọrọ.
Ka ọ ọkwụ ugbua, ozi na-eru BBC Igbo nti site Oraifite na-akọwa na ebe niile dịzi ka ebe agbara ọsọ agha.
Nke a abụghị mbụ ndị nchekwa na ndị Ipob ọrụ nchekwa ka eko isi na nso a, dịka akukọ pụtara na mgbọ tụrụ ndị mmadụ mgbe ndi uweojii gara itisa ebe ndị Ipob na-eme ọgbakọ n'Ebonyi steeti.
Cheta na gọọmenti Naịjirịa akpụtala kwuo na Ipob bụ otu oyi egwu, bụ atụmatụ ụlọikpe kwenyekwara.
Atụmatụ a nyere ha ikike ịmachi iso maọbụ ime emume dika Ipob na Naịjirịa.
Ifeanyi Ejiofor nọ n'isi ndi na-agba ụlọikpe ịhụ na ewezụgara ya bu atụmatu gụnyere Ipob n'ime ndi oyi ndụ egwu.










