Oraifite dị chakoo n'mgbede ụnyaahụ
Okporoụzọ adịbeghị ka ọ na adịbu n'Oraifite.



Ihe niile i dị mkpa mere n' ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị Ipob n'Oraifite Anambara steeti n'ụlọ Ifeaaanyị Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu na ndị uweojii.
Uche Akolisa
Okporoụzọ adịbeghị ka ọ na adịbu n'Oraifite.



Ndị Oraifite amachiela emume ndị mmọnwụ isii na ndị Ipob na be ha.
Nke a na-abịa dịka egburu ndị uweojii abụọ n’ọgbaghara dara n’etiti ndị Ipob na ndị uweojii na be Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor.
Dịka ndị Oraifite siri kọwa, ọgbaghara a pụtara dịka ndị otu mmọnwụ abụọ malitere isi okwu ebe a na-akwa ozu.
Ọ bụ ndị Oraifite Improvement Union (OIU) kwuru nke a n’Ọka ụbọchị Wednesde.
Ndị mmọnwụa amachiri bụ Otu-Eke, Otu-Afọ, Otu-Orie, Otu-Ube na Otu-Ayaka.
Offor Uche bụ onyeisi OIU na Igwe Oraifite bụ Daniel Udeoji binyere aka n’ozi a.
Ozi ha sị: “Ndi na-achị Oraifite agaghị agba nkịtị ka ndị omekome nara anyị obodo anyị ma mebie aha anyị,
“Ihe mere n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Dicemba abụghị usoro njirimara Oraifite.”

Anyi ka na-etinyekwe anya n'ihe mere na Oraifite.
Ka taa na-aga, anyị ga na-ewetere unu ihe ọhụru pụtara na ya bụ okwu.
Na mbido, ndị uweojii kwuru na ha nwetara mkpesa megidere Ọkaiwu Ifeanyị Ejiofor, kpọọ ya oku, ọ zaghị ha, ha gaa n'ụlọ mana ndị Ipob luso ha ọgụ, gbuo mmadụ abụọ ndị otu ha.
Ha gara n'ihu rịọ onye ọbụla hụụ Ejiofor ka ọ gbara ha ama.

Ebe foto si, Ifeanyị Ejiofor- Facebook/NPF
Mana Ipob gọrọ si na onweghị ozi ọkaiwu ha natara, kama na ndị uweojii wakporo ụlọ Ejiofor, sunye ya ọkụ gbagbuo ọtụtụ mmadụ nkiti enweghị ngwa ọgụ ha ji suo ụgbọala na ozu ndị ahụ ọkụ iji mee ka a ghara inwe ihe aka ebe.
Lee akụkọ ihe merela kemgbe ahụ: https://www.bbc.com/igbo/afirika-50631291
Onye ntaakụkọ BBC igbo gara ebe ihe mere bụ Ebere Ekeopara kwuru na obodo bụ igwe n'ebe Ifeanyị Ejiofor oge o ruru nso ebe ha nke mere ka ọgbaa ọsọ ndụ.
Gee ihe okwuru n'ọnụ ya:
Dịka o merela abalị atọ ọgbaaghara dapụtara n’etiti ndị uweojii na ndị otu IPOB n’Oraifite, Gọọmentị Anambra Steeti ekwubeghị pịm.
Otu onye welitere isi na gọọmentị Anambra gwara BBC na ha ka na-eche ka ndị uweojii, ndị ọgbakọ Obodo na Igwe ndị Oraifite kọwaara ha ihe merenu nke ọma tupu ha ekwuo ihe ọbụla maka ọdachi ahụ tarala isi mmadụ.

Ebe foto si, Willie Obiano/Twitter

Ebe foto si, iStock
Ndị ndu obodo Ọraifite ekwuola na ọ bụ nghọtahie dị n'etiti otu mmọnwụ butere ọgbaghara dapụtara n'Oraifite n'ụbọchị Monde.
Cheta na ndị mmadụ gụnyere ndị uweojii abụọ nwụrụ dịka ndị Ipob na ndị uweojii kwatara oge ndị uweojii wakporo ụlọ ọkaiwu otu Ipob bụ Ifeanyị Ejiofor maka ebubo imaja na ịtọrọ mmadu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana ndị ndu obodo ahụ gụnyere Sunny Igboanuzue bụ President-General Oraifite Improvement Union, odeakwụkwọ ya bụ Offor Uche, na eze obodo ha bụ Igwe Daniel Udeoji kwuru na ọ bụ ndị mmọnwụ mere ede jiri bee nwịị.
N'akwụkwọ ozi ha wepụtara dịka ha na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka n'Ọka ụbọchị Wenezde, ha katọọ ọ ogbugbu e gburu ndị uwe ojii ma kwuo na ha agaghị agba nkịtị ndị omekeome a na-akpa ike n'ala ha.
Ha gara n'ihu machie otu mmọnwụ isii maka ibute ọgbaghara n'obodo ahụ.
Otu mmọnwụ ihe ndị megidere bụ; Otu-Afor, Otu-wo, Otu-Orie and Out-Ube, Otu Ayaka na mmọnwụ ọbụla na-agba n'abalị.
Kemgbe Monde ka Oraifite na-enwu ọkụ dịka ndị uweojii na ndị Ipob kwadara oge ndị uweojii wakporo ụlọ ọkaiwu otu Ipob.
Lee ihe onye ntaakụkọ BBC hụrụ n'obodo ahụ ka ọ gara ya ụbọchị Wenezde:

Oke n'ọsọ ngwere n'ụzọ n'Obodo Oraifite , Anambara steeti dịka ọgbaghara dara n'etiti ndị uweojii na ndị otu Ipob na-aga n'ihu taa bụ Wenezde.
Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ kọwara na ọ bụ naani ụmụ nwaanyị nọzị n'ụzọ nakwa n'ahịa Nkwọ Oraifite azụ ahịa n'ihi egwu na ndị uwe ojii ga-abịa bọrọ ọbọ maka ndị otu ha nwụrụ anwụ.
Ka ọ dị ụgbua, ebe niile n'Oraifite juru oyi.
Mgbe BBC rutere n' ụlọ Igwe Oraifite bụ Daniel Udoji, o nweghị onye anyị hụrụ n'ụlọ ya.
Mbọ niile anyị gbara la anyị gaa n'ụlọ Ifeanyi Ejiofor ebe ya bụ mkpa mkpa nọrọ kpaa amịtaghị mkpụrụ n'ihi na Obodo ka nọ na katakata.

Nke onye chiri ya zere!
Sonyere anyị maka iwetara ụnụ nke na ebe kemgbe nsogbu dapụtara n'etiti ndị uweojii na Ndị Ipob n'Oraifite,Anambara steeti